Ị̀ Pụrụ Ịmata Ọdịiche Dị n’Etiti Ezi Ihe na Ihe Ọjọọ?
“Egburu m ihe dị ka mmadụ 25. . . . Ana m ahụ onyinyo ya n’uche m kwa abalị, kwa ụbọchị. Ana m arọ nrọ ọjọọ. . . . Apụrụ m ịga ebe ụfọdụ ma hụ otu ihu nke na-echetara m ndị ahụ m gburu. Apụrụ m ịhụ nke ahụ nke ọma, dị ka a ga-asị na o mere taa, ugbu a. . . . Apụghị m ịgbaghara onwe m maka ihe ndị m mere.”—V.S.
“E nyere m iwu ịbanye n’ebe ahụ ma laa ndị iro n’iyi. . . . Anọdụghị m ala ma chee banyere ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka. . . . Echere m mgbe ahụ, ka nọgidekwa na-eche na emere m dị ka e si tụziere m, emezukwara m iwu ndị e nyere m, echeghịkwa m na m mere ihe ọjọọ n’ime otú ahụ.”—W.C.
NA March 16, 1968, ndị ikom abụọ ahụ e hotara n’elu keere òkè n’ihe a ga-emesị kpọọ ajọ mpụ nke agha. Ha onwe ha, tinyere ndị soja ndị ọzọ, banyere n’otu obobo nta nke Vietnam ma gbuo ọtụtụ narị ndị nkịtị—gụnyere ndị inyom, ụmụaka, na ndị agadi nwoke. Ma rịba mmeghachi omume ndị dị iche nke ndị soja abụọ ndị a ama. Onye soja nke mbụ nwere mwute n’ụzọ doro anya maka ihe o mere. Onye nke abụọ na-eche na ihe ndị o mere ziri ezi. Olee otú mmadụ abụọ pụrụ isi meghachi omume n’ụzọ dị nnọọ iche n’otu ahụmahụ?
Azịza ya metụtara akọ na uche—ikike uche Chineke nyere nke na-enyere anyị aka ile onwe anyị anya otú anyị dị n’ezie ma tụlee omume na nzube anyị. Akọ na uche bụ echiche ime anyị nke ezi ihe na ihe ọjọọ.
Mgbe ha na-eme mkpebi, ụfọdụ mmadụ na-adabere n’ilu ahụ bụ́, “Kwe ka akọ na uche gị duzie gị.” Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, akọ na uche bụ ihe a na-apụghị ịdabere na ya mgbe dum. N’ezie, ọtụtụ anagidewo, ọbụnakwa tinye aka n’arụrụala ndị jọgburu onwe ha, ma akọ na uche ha enyetụbeghị ha nsogbu ma ọlị. (Jọn 16:2; Ọrụ 8:1) Dị ka onye edemede bụ́ onye England bụ́ Samuel Butler kwuru n’otu mgbe, akọ na uche “na-ahapụ n’oge na-adịghị anya ịgwa ndị na-adịghị achọ ige ya ntị okwu.”
Ị̀ pụrụ ịtụkwasị akọ na uche gị obi? Azịza ya na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’otú e si zụọ ya nke ọma, dị ka isiokwu na-esonu ga-egosi.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Ebe a na-alụ agha nke dị n’elu: U.S. Signal Corps photo