Ọrụ nke ‘Na-aghaghị Ịkpali Nkwanye Ùgwù’
PITA onyeozi dọrọ ndị Kraịst ibe ya aka ná ntị, sị: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto . . . n’ime ihe ahụ ha na-ekwutọ unu n’ime ya dị ka ndị na-eme ihe ọjọọ.” (1 Pita 2:12) Ruo ọtụtụ afọ Ndịàmà Jehova n’Itali egosipụtawo ibi obi ọma dị otú ahụ n’ihu ọha. Na mmụọ ntụziaka Jisọs ‘ikwusa site n’elu ụlọ,’ ha na-arụ ọrụ ndị Kraịst ha nile n’ìhè, n’ebe ọha na eze na-ahụzu ha. (Matiu 10:27; Jọn 18:20) N’ihi ya, mgbe otu ọkàiwu bụ́ onye Itali na otu ụkọchukwu bipụtara ebubo na Ndịàmà Jehova bụ “ịrọ òtù okpukpe ụgha” ma gụnyekọọ ha “n’òtù nzuzo ndị na-amata ndị mmadụ n’ọnyà,” Ndịàmà kpebiri ịgba akwụkwọ n’ụlọikpe n’ihi okwu ndị ahụ na-emebi aha.
N’ikpe mbụ e kpere, ụlọikpe kwubiri na ọkàiwu ahụ na ụkọchukwu ahụ adaghị iwu ọ bụla. Otú ọ dị, na July 17, 1997, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Venice kagburu mkpebi ikpe nke ụlọikpe mbụ ahụ, na-achọpụta na ikpe mara mmadụ abụọ ahụ na-azara ọnụ ha. Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe ahụ kwuru, sị: “Isiokwu abụọ ndị ahụ e bipụtara nwere okwu na nkebi okwu ndị pụrụ n’ezie imebi aha ọma nke ndị na-ekpe okpukpe nke ‘Ndịàmà Jehova.’ O yiri ka o doro anya na nzube e ji dee isiokwu ndị ahụ bụ iji mee ka ọha na eze na-elelị ndị na-ekpe ya anya.” Ụlọikpe ahụ kwuru na isiokwu ndị ahụ “esoghị n’ihe ndị iwu kwadoro n’ikike nke ịkọ akụkọ na ime nkatọ.” Ụlọikpe ahụ riri ndị mmebi aha abụọ ahụ nhá ma nyekwa ha iwu ka ha kwụọ mmefu nile nke ụlọikpe, gụnyere mmefu nile nke Ndịàmà mere maka okwu ikpe abụọ ndị ahụ.
N’ime mkpebi ikpe ya e dere ede, Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Venice kwuru, sị: “Nanị site n’imesi ike na ichebe ikike nile nke Ụkpụrụ Iwu [Itali] nyere ka ọ pụrụ ikwe omume igbochi ụdị dị iche iche nke ekweghị ibe nọrọ na ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè.” Mkpebi ikpe ahụ kwetara na ọrụ Ndịàmà Jehova abụghị nke nzuzo ma ọ bụ okpukpe ụgha. “Ịgụnyekọta Ndịàmà n’òtù nzuzo,” ka ụlọikpe ahụ kwuru, “adịghị asọpụrụ ọbụna ụkpụrụ nke ịbụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme, ebe ọ bụ na okpukpe ahụ a na-akpọsa dị n’ọtụtụ obodo ukwu, a makwaara ọrụ ime ndị na-eso ụzọ zuru ebe nile nke ndị òtù ya na-arụ, karịsịa n’ụbọchị Sunday nakwa n’ụbọchị ezumike ndị ọzọ, nke ọma, ọ ghaghịkwa ịkpali nkwanye ùgwù maka mgbalị ndị e mere, n’agbanyeghị ihe ọ bụla mmadụ pụrụ iche banyere ozizi e kwusara.” Ya mere, ihe ndekọ nke iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa na ibi obi ezi ihe nlereanya nke Ndịàmà Jehova n’Itali enyewo aka n’iweta ajọ mbunobi megide ha ná njedebe.—Matiu 5:14-16; 1 Pita 2:15.