Okwu Gị Ọ̀ Bụ Ihe Ndụpu Ka Ọ Bụ Ihe Ngwọta?
N’OGE ndị a tara akpụ, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ bụ ndị “obi ha tiwara etiwa” na ndị “a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) N’ihi ya, n’okwu nke Pọl onyeozi, e nwere mkpa siri ike nke ‘ịgụgụ ndị dara mba n’obi,’ na ‘inyere ndị na-adịghị ike aka.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ ibe anyị emejọọ anyị ma ọ bụ mee ihe jọrọ njọ nke ukwuu? N’ọnọdụ dị otú ahụ, anyị pụrụ iche na anyị ziri ezi n’iji olu ike gbazie onye ahụ olu. Otú ọ dị, e kwesịrị ịkpachara anya. Ndụmọdụ, ọbụna mgbe o kwesịrị ekwesị, pụrụ ịbụ ihe na-emerụ ahụ ma ọ bụrụ na e nye ya n’ụzọ na-agba agba ná ntị. Ilu 12:18 na-ekwu, sị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.”
Ya mere, mgbe anyị chọrọ inye mgbazi ma ọ bụ idozi nghọtahie, ọ dị mkpa icheta akụkụ nke abụọ nke Ilu 12:18: “Ire ndị maara ihe bụ ihe na-agwọ mmadụ.” Jụọ onwe gị mgbe nile, sị, ‘Ọ bụrụ na mgbazi adị m mkpa, olee otú m ga-achọ ka e si mesoo m?’ Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-anakwerekarị agbamume karịa nkatọ. Ya mere bụrụ onye na-ajakarị mma. Nke a ga-eme mgbe mgbe ka onye ahụ gahierenụ nwee nkwali imeziwanye ihe, o yikarịkwara ka ọ ga-enwe ekele maka aka ọ bụla e nyeere ya.
Lee ka o si dị oké mkpa anyị ikwu okwu n’ịdị nwayọọ mgbe nile! Okwu na-agwọ agwọ ga-eme ka onye ahụ na-ege ntị nwee mmetụta dị ka ọbụ abụ ahụ nwere, bụ́ onye dere, sị: “Ka onye ezi omume tigbuo m, ọ ga-abụ ebere; ya baakwara m mba, ọ ga-abụ mmanụ isi; ekwela ka isi m sị, Ee e.”—Abụ Ọma 141:5.