Ịmụta Ihe Site n’Ihie Ụzọ Ndị Gara Aga
IWU omume nke Onye Okike anyị na-adịru ebighị ebi, ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe. N’ihi nke a ụkpụrụ ahụ a na-achọta ná Ndị Galetia 6:7 dị irè taa: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.” N’eziokwu, mmadụ pụrụ ịsị na ya ekwesịghị ịza Chineke ajụjụ, ma iwu Chineke ahụ na-adịgide mgbe nile. Mee elu mee ala, ọ dịghị mmadụ ọ bụla na-agaghị enweta ihe sitere n’omume ya pụta.
Gịnị banyere onye biri ndụ na-adịghị mma ma mesịa gbanwee, na-aghọ ohu Chineke? O nwere ike ọ ghaghị ịnagide ihe ndị si n’ụzọ ndụ mbụ ya pụta. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Chineke agbagharabeghị ya. Ịkwa iko nke Eze Devid na Bat-sheba wetara ọdachi dị ukwuu n’ime ndụ ya. Ọ pụghị ịgbanarị nke a. Ma o chegharịrị, ọ natakwara mgbaghara Chineke.—2 Samuel 12:13-19; 13:1-31.
Ì nwetụwo nkụda mmụọ mgbe ị na-enweta ihe ndị sitere n’ihie ụzọ gị pụta? Ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ ziri ezi, inwe mwute pụrụ ichetara anyị ‘ilezi anya, ghara iche ajọ ihe ihu.’ (Job 36:21) Ee, inwe mwute pụrụ inyere anyị aka izere imeghachi ihe na-ezighị ezi. Nke kakwa mma, Devid ji ahụmahụ o nwetara site na mmehie o mere baara ọ bụghị nanị onwe ya kamakwa ndị ọzọ uru. Ọ sịrị: “M ga-ezi ndị njehie ụzọ Gị nile; ndị mmehie ga-alaghachikwutekwa Gị.”—Abụ Ọma 51:13.
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Devid mụtara ihe site na mmehie ya na Bat-sheba