Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 5/15 p. 32
  • Ezi Àgwà Eweta Otuto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Àgwà Eweta Otuto
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 5/15 p. 32

Ezi Àgwà Eweta Otuto

AKWỤKWỌ akụkọ Itali bụ́ La Gazzetta del Mezzogiorno jara Ndịàmà Jehova mma maka ibipụta isiokwu bụ́ “Matera—Obodo nke Ọ́gbà Bụ́ Ebe Obibi Ndị Pụrụ Iche.” Isiokwu a pụtara ná mbipụta magazin Teta! nke July 8, 1997 (Bekee), nke nwere nkesa sara mbara n’ọtụtụ asụsụ. A na-asụgharị Teta! ugbu a gaa n’asụsụ 81, o nwekwara nkesa nke ihe karịrị nde 19 gburugburu ụwa. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru na Teta! mere ihe akụkọ ọkaibe nke oge okpomọkụ “ma a bịa n’ihe banyere ime mkpọsa iji kwalite ihe nketa nke akụkọ ihe mere eme na nkà nke obodo ahụ [Matera].”

Akwụkwọ akụkọ ahụ toro Ndịàmà n’ihe metụtara Mgbakọ Distrikti “Okwukwe n’Okwu Chineke” nke e nwere na Matera na 1997. Isiokwu ahụ rịbara ama na Ndịàmà gbalịrị “kpọta mmadụ 4,000 n’Ámá Egwuregwu XXI Settembre [nke obodo ahụ] n’etiti oge okpomọkụ na n’okpuru anyanwụ na-achasi ike; ha ahụwo maka mkpocha, ntegharị ágbá, na mmeziwanye bụ́ isi nke ọgbọ egwuregwu a (karịsịa ụlọ mposi) n’anaghị ego ma ọlị, na-akwụ ụgwọ mmefu maka nzụta nke ngwá ọrụ ndị dị mkpa n’onwe ha.”

Ndịàmà Jehova na-agbalị ịbụ ezi ndị agbata obi. (Matiu 22:37-39) Ha na-agbasokwa ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, bụ́: “Na-ebinụ obi unu nke ọma n’etiti ndị mba ọzọ; ka ha wee site n’ọrụ ọma nile unu, nke ha na-ele anya, nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ahụ.”—1 Pita 2:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya