Gịnị Ma I Sonyere Ha?
NDJAUKUA ULIMBA dị afọ 73, n’afọ gakwara aga o mere njem dị ihe dị ka kilomita 450. O ji ụkwụ gaa njem ahụ dum, o wekwara ya ụbọchị 16.
Nwoke a meworo agadi mere ogologo njem ya iji gaa otu n’ime mgbakọ Ndịàmà Jehova a na-eme kwa afọ. Mgbe mgbakọ ahụ gasịrị, n’ịbụ onye ọṅụ jupụtara obi na onye e wusiri ike n’ụzọ ime mmụọ, o ji ụkwụ laghachikwa ụlọ—ụbọchị 16 ọzọ. Ò kwesịrị mgbalị ahụ? Eenụ! Ndjaukua Ulimba emewo njem a kwa afọ ruo afọ ụfọdụ.
Nwoke Africa a bụ otu n’ime ihe karịrị nde mmadụ 15 sitere ihe karịrị mba 230 bụ́ ndị gara mgbakọ Ndịàmà Jehova n’afọ gara aga. Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka ihe ka ọtụtụ jee ije ọtụtụ ụbọchị iji gaa n’ebe a na-eme mgbakọ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ji ụgbọala, bọs, ụgbọ okporo ígwè, ma ọ bụ ụgbọelu gaa. Ị̀ bụ otu n’ime ha?
Na 1998, a ga-enwekwa mgbakọ ọzọ gburugburu ụwa, karịsịa n’ọnwa ndị nke oge okpomọkụ (ma ọ bụ n’oge ọkọchị). Ọ bụrụ na ahụ adị ya ike, o yikarịrị ka Ndjaukua Ulimba ga-emekwa otu ogologo njem ahụ iji gaa. Ya na ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-anụrụ usoro ihe omume dị irè, na-ewusi okwukwe ike, ma na-enye ume ọhụrụ. Nye ndị nile ga-abịanụ, mgbakọ ahụ ga-abụ ihe dị mkpa n’afọ. E ji ikpo ọkụ na-akpọkwa gị onwe gị òkù ịbịa. Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ ịgwa gị ebe a ga-enwe mgbakọ dịkarịsịrị gị nso.