“I Sitere n’Oge Ị Dị na Nwa Ọhụrụ Mata”
DỊ KA ihe ọmụmụ sayensị e mere na nso nso a na-egosi, ikwusara ụmụ ọhụrụ okwu n’ụzọ dị omimi na-emetụta ito eto nke ụbụrụ ha, na-eme ka ike iche echiche, ịtụgharị uche, na ịgwọta nsogbu ha gbanye mkpọrọgwụ. Nke a bụ eziokwu karịsịa n’afọ mbụ nke ndụ nwa ọhụrụ. International Herald Tribune na-akọ na ụfọdụ ndị nchọpụta kwere ugbu a na “mkpụrụ okwu ole nwa ọhụrụ na-anụ kwa ụbọchị bụ otu ihe kasị mkpa ga-ekpebi ọgụgụ isi, ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ na iru eru n’iso ọha na eze emekọrịta ihe n’ọdịnihu.”
Otú ọ dị, okwu ndị e kwuru ekwu ga-esirịrị n’ọnụ mmadụ. O yiri ka telivishọn ma ọ bụ redio abụghị ihe nnọchianya ya.
Onye ọkà mmụta sayensị akwara na Mahadum Washington dị na Seattle, U.S.A. sịrị: “Anyị maara ugbu a na a na-eguzobe usoro njịkọ akwara mgbe a ka bụ nwata nakwa na n’ụzọ nkịtị ụbụrụ nwa ọhụrụ nọ na-echere ahụmahụ dị iche iche iji kpebie otú a ga-esi mee njikọ ndị ahụ. Anyị aghọtaghị ruo nnọọ na nso nso a oge usoro a ji amalite. Dị ka ihe atụ, ụmụ ọhụrụ amụtawo ụda asụsụ obodo ha mgbe ha dị ọnwa isii.”
Nchọpụta na-agbagha echiche zuru ebe nile nke bụ́ na ụmụ ọhụrụ ga-etowanye n’ọgụgụ isi ma ọ bụrụhaala na a na-egosi ha ịhụnanya nke ukwuu. O mesikwara ike ọrụ ndị mụrụ ụmụ nwere n’ito eto nke nwatakịrị.
Nke a na-echetara anyị okwu ndị dị n’akwụkwọ ozi ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl onyeozi degaara Timoti: “I sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ọ ga-abụworị na ihe dị nsọ nile e dere n’akwụkwọ nsọ a gwara nwa ọhụrụ bụ́ Timoti site n’ọnụ nne na nne ya ochie bụ́ ndị kwere ekwe, rụrụ ọrụ gbara ọkpụrụkpụ n’uto ya dị ka onye ozi Chineke pụtara ìhè.—2 Timoti 1:5; 3:15.