“Bible Otu Mkpịsị Aka”
N’ỊBỤ onye ahụ ya kpọnwụrụ mgbe ọ rịasịrị strok oké anwụ ọchịcha kpatara, Joseph Schereschewsky pụrụ ide ihe nanị site n’iji ígwè typewriter, na-eji otu mkpịsị aka nke aka nke ọ bụla. Ma o ruru ihe mgbaru ọsọ ya—ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ Chinese, otu n’ime asụsụ ndị kasị siere onye ala ọzọ ike ịmụta.
N’ịbụ onye Juu n’ọmụmụ, Schereschewsky chọpụtara ma nara Iso Ụzọ Kraịst dị ka onye toworo eto. O mesịrị ghọọ onye ozi ala ọzọ na China. N’ebe ahụ, o keere ókè n’ọtụtụ ọrụ nsụgharị, na-amalite laarị azụ na 1866 ma dịrị banye n’afọ ndị mbụ nke narị afọ nke 20. N’ihi nzụlite Juu ya, Schereschewsky maara asụsụ Hibru nke ukwu karịa ndị ọkà mmụta ibe ya. N’ihi ya, e nyere ya ibu ọrụ ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ Hibru nile. Ka ọ na-eru n’ọgwụgwụ nke ọrụ ya weworo oge dị anya, o mepụtakwara Bible zuru ezu nwere ntụaka ná nsụgharị Chinese.
Dị ka onye nsụgharị Bible, Joseph Schereschewsky bụ onye na-akwadosi nsụgharị ndị dị n’asụsụ ndị nkịtị ike. Ma ọrụ ya abụghị nke dị mfe. Ụtụ ọ tụnyere na Bible Chinese pụrụ iche, ka akwụkwọ bụ́ The Book of a Thousand Tongues na-ekwu, “n’ihi na o zuru nnọọ ezu, a rụzukwara ya n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike.”
Mgbe aka Schereschewsky kpọnwụrụ, ọ nọgidere na-aga n’ihu n’ọrụ ya. Iji ígwè typewriter ede ihe chọrọ mgbalị dị ukwuu, ebe ọ bụ na o nweghịkwa ike iji aka ya eme ihe otú o kwesịrị. Ya mere, ọ kpọrọ nsụgharị a Bible otu mkpịsị aka ya. Iji mepụta ya n’agbanyeghị nkwarụ ya, Schereschewsky tachiri obi ruo afọ 25. Site na-adaghị mbà, o keere òkè n’ime ka Okwu Chineke kwe nghọta na Chinese—bụ́ asụsụ ndị ka ọtụtụ na-asụ karịa nke ọ bụla ọzọ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 11]
Ihe osise abụọ a: Site n’ikike nke American Bible Society Archives