Ndị Dọkịta, Ndị Ọkàikpe, na Ndịàmà Jehova
LAA azụ na March 1995, Ndịàmà Jehova hụrụ maka nzukọ ọmụmụ ihe abụọ na Brazil. Gịnị bụ nzube ha? Ịchọ mmekọrịta nke ndị ọrụ ahụ ike na ndị ọrụ iwu mgbe onye ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, bụrụkwa onye na-apụghị ịnara mmịnye ọbara.—Ọrụ 15:29.
N’ụzọ dị mwute, n’ọnọdụ ụfọdụ ndị dọkịta elegharawo ọchịchọ nke Ndịàmà na-arịa ọrịa anya ma chọọkwa ịnata ikike ụlọikpe iji mịnye ha ọbara n’ike. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, Ndịàmà jiri ụzọ ọ bụla iwu kwadoro chebe onwe ha. Otú o sina dị, ha na-ahọrọ mmekọrịta kama esemokwu. N’ihi ya, nzukọ ọmụmụ ihe ndị ahụ mesiri ya ike na e nwere ọtụtụ ihe a pụrụ iji dochie anya usoro ọgwụgwọ mmịnye ọbara dabakọrọnụ nakwa na Ndịàmà Jehova na-eji obi ụtọ anakwere ndị a.a
Otu nzukọ nke Kansụl Ógbè Na-ahụ Maka Ọgwụ na São Paulo akwadoworị ọnọdụ Ndịàmà. Na January 1995 o kpebiri na ọ bụrụ na e kwetaghị n’ọgwụgwọ nke dọkịta tụrụ aro ya, onye ọrịa nwere ikike ịjụ ya ma họrọ dọkịta ọzọ.
N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ugbu a e nwere ọtụtụ narị n’etiti ndị ọrụ ahụ ike na Brazil bụ́ ndị dị njikere inye ndị ọrịa ha rịọrọ maka ya ọgwụgwọ n’ejighị ọbara. Kemgbe e nwesịrị nzukọ ọmụmụ ihe nke March 1995 ahụ, mmekọrịta n’etiti ndị dọkịta, ndị ọkàikpe, na Ndịàmà Jehova na Brazil akawanyewo mma nke ukwuu. Na 1997 magazin ahụ ike ndị Brazil bụ́ Âmbito Hospitalar bipụtara otu isiokwu nke mesiri ike ikike Ndịàmà Jehova nwere ịhụ na a kwanyeere nguzo ha n’okwu metụtara ọbara ùgwù. Ọ bụ ihe a maara ebe nile ugbu a na, dị ka Kansụl Ógbè Na-ahụ Maka Ọgwụ na steeti Rio de Janeiro na nke São Paulo si kwuo, “ọrụ dọkịta ichebe ndụ onye ọrịa ya ekwesịghị ịkarị ọrụ ya ịzọchitere ikike onye ọrịa ahụ nwere ime nhọrọ.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee broshuọ ahụ bụ́ How Can Blood Save Your Life?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.