Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 2/15 p. 32
  • Chineke Ọ̀ Ga-ebibi Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ọ̀ Ga-ebibi Ụwa?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 2/15 p. 32

Chineke Ọ̀ Ga-ebibi Ụwa?

DỊ KA Popu John Paul nke Abụọ si kwuo, ụmụ mmadụ pụrụ iji obi ike lepụ anya n’ọdịnihu. O kwuru na, n’akụkọ ihe mere eme nile, “ndị mmadụ anọgidewo na-eme mmehie, ikekwe ọbụna ndị karịrị ndị ahụ a kọwara tupu iju mmiri ahụ.” N’agbanyeghị nke ahụ, popu kọwara, sị, “site n’okwu ọgbụgba ndụ nke Chineke so Noa gbaa anyị na-aghọta na ugbu a ọ dịghị mmehie nke pụrụ ime ka Chineke bibie ụwa nke ya onwe ya kere.”

Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke agaghị ebibi ụwa ma ọlị? Bible na-ekwu na mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, Chineke gwara Noa, sị: “A gaghị ebipụkwa anụ ahụ nile ọzọ site na mmiri nke iju mmiri ahụ; iju mmiri agaghị adịkwa ọzọ ibibi ụwa.” (Jenesis 9:11) Popu na-ekwu na site n’okwu ndị a, Chineke “manyere onwe ya ichekwa [ụwa] pụọ ná mbibi.”

Bible mere ka o doo anya na Onye Okike agaghị ekwe ka e bibie mbara ụwa anyị. “Ụwa na-eguzoru mgbe ebighị ebi,” ka Bible na-ekwu. (Eklisiastis 1:4) Ma e nwere ihe ọzọ a ga-amụta site n’Iju Mmiri ahụ—ihe popu na-ekwughị okwu banyere ya.

Jisọs sịrị na ọnọdụ ndị ga-adị n’ụwa n’oge ọnụnọ ọdịnihu ya ga-adị “dị ka ụbọchị Noa dịrị,” mgbe ndị mmadụ ‘na-amaghị ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile.’ (Matiu 24:37-39) N’otu aka ahụ, Pita onyeozi dere na dị nnọọ ka ‘ụwa nke dị n’oge ahụ lara n’iyi, n’ihi na iju mmiri gbara ya,’ otú ahụkwa ka “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” na-erugharị n’isi ụwa nke oge a.—2 Pita 3:5-7.

Jisọs na Pita hà chefuru ọgbụgba ndụ Chineke so Noa gbaa? Ọ dịghị ma ọlị! Dị nnọọ ka o kwuru n’ọgbụgba ndụ ya na Noa, Chineke agaghị eji iju mmiri weta ajọ usoro ihe a ná njedebe. Kama nke ahụ, ọ ga-eji ike nke “Eze kachasị ndị eze nile na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe [Apọkalips] 19:11-21) Ya mere, dị ka Bible na-ekwu, a gaghị ebibi elu ala, kama “ụwa” nke ajọ ihe a kpọrọ mmadụ ga-abịarịrị ná njedebe. (Ilu 2:21, 22; Mkpughe 11:18) Mgbe nke ahụ gasịrị, “ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya