Ehighị Ụra Abalị Ndị Bara Uru
ỌBỤNA ndị eze na-anọ n’ehighị ụra abalị. Onye ọchịchị Peasia dị ike na narị afọ nke ise T.O.A., bụ́ Ahasuerọs, nwere ahụmahụ otu n’ime ha. Ikekwe n’iche na ya elegharawo ọrụ ụfọdụ anya, o mere ka a gụọrọ ya ihe ndekọ eze. Ọ chọpụtara na otu ohu kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Mọdekaị, emebiwo otu nkata a kpara igbu ya ma e nyebeghị ya ụgwọ ọrụ. Ahasuerọs kpebisiri ike idozi nchefu a ozugbo. Mmetụta bara uru omume ya nwere n’ebe ndị Chineke nọ na-egosi na ọ bụ Chineke kpatara ehighị ụra nke ọma nke eze ahụ.—Esta 6:1-10.
Ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’obodo South Africa dị n’ụsọ oké osimiri bụ́ Hermanus nwere ihe mere ha ga-eji cheta akụkụ a nke Bible. Ha na-ezukọbu n’ụlọ nzukọ a gbazitere agbazite. Ruo ọtụtụ afọ, ha agbalịwo ịzụta ala ịrụ Ụlọ Nzụkọ Alaeze nke ha. N’ikpeazụ, na 1991, Kansụl Obodo ahụ kwere ire otu ọmarịcha ala.
Otú ọ dị, ụfọdụ megidere iresị Ndịàmà Jehova ala a. Mgbe e gbusịrị oge ọnwa ole na ole, a gwara ọgbakọ ahụ na nkwụsịtụ ga-adịru afọ atọ banyere iresị chọọchị ala, a kagbukwara nkwa inye ala ahụ. Na May 1993 ọgbakọ ahụ dere akwụkwọ ọzọ, na-arịọ kansụl ahụ ka ha tụlegharịa mkpebi ha. Ha nwetara akwụkwọ ozi nwere otu ahịrịokwu ná nzaghachi, na-ekwu na nkwụsịtụ ahụ ka dị irè.
N’October nke afọ ahụ, otu n’ime ndị kansụl obodo ahụ ehighị ụra n’abalị. O ji oge ahụ na-agụ ihe ndekọ ochie nzukọ kansụl ahụ nwere ịhụ ma e nwere okwu chọrọ nlebara anya. Akwụkwọ ozi ahụ Ndịàmà dere na-arịọ kansụl ahụ ka ha tụlegharịa mkpebi ha dọọrọ mmasị ya. N’ihi ya, o kpebiri itinye okwu ahụ n’isi ihe ndị a ga-atụle ná nzụkọ ha ọzọ. Ọ chọrọ igosipụta na Ndịàmà Jehova etinyewo akwụkwọ maka ala tupu e nwee nkwụsịtụ nke ala maka chọọchị.
Mgbe oge na-aga, e nyere ọgbakọ ahụ otu ala ahụ a chọrọ inye ya na mbụ na 1991! Ọ dịpụrụ n’okporo ụzọ, ebe na-adịrị ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na ndị nwere mmasị mfe iru. Ha arụwo otu ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke a raara nye Jehova n’October 5, 1996.
Ọ bụ ezie na ọgbakọ ahụ na-enwe mwute maka nsogbu ehighị ụra abalị nke onye kansụl ahụ, ọ pụrụ ịbụ onye a kasiri obi site n’eziokwu ahụ bụ na ọbụna Eze Ahasuerọs nwere otu. Ihe sikwa n’ọnọdụ abụọ ahụ pụta bara uru. N’ezie, ọgbakọ ahụ dị na Hermanus nwere obi ekele dị ukwuu maka inwe Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha, ebe bụ isi maka ofufe dị ọcha na ọzụzụ ọchịchị Chineke n’obodo a na-ewu ewu nke dị n’ụsọ oké osimiri.—Ndị Hibru 10:24, 25.