Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/15 p. 3-4
  • Ụwa Ezi Ikpe Ọ̀ Na-agụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa Ezi Ikpe Ọ̀ Na-agụ Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Kwesịrị Ime ma E Megbuo Gị Ma Ọ Bụ Ndị Ọzọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Ị Pụrụ Idi Ikpe Na-ezighị Ezi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • À Ga-enwerịrị Ikpe Na-ezighị Ezi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/15 p. 3-4

Ụwa Ezi Ikpe Ọ̀ Na-agụ Gị?

OTU ụgbọ mmiri na-aga aga nke e ji osisi wuo, nke nwere ákwà ifufe atọ na okpukpu abụọ abịaruo nso ụsọ ebe bụ ugbu a Cape Cod, Massachusetts, U.S.A. Ike gwụsịrị ndị na-akwọ ya na ndị njem 101 o bu n’ihi ịnọ n’oké osimiri ruo ụbọchị 66. N’ịchọ ịgbanarị mkpagbu okpukpe na ihe isi ike akụ̀ na ụba, ha agawo njem siri nnọọ ike gafere Oké Osimiri Atlantic.

Mgbe ndị nọ n’ụgbọ a, bụ́ Mayflower, hụrụ ala na November 11, 1620, anya ha gburu mara mara n’olileanya nke mmalite ọhụrụ. N’inwe ọchịchọ nke ịtọ ntọala maka ụwa ka mma, ihe ka n’ọtụtụ ndị ikom toworo eto nọ n’ụgbọ ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ Ọgbụgba Ndụ Mayflower. N’ime ya ha kwekọrịtara iti “iwu ezi omume na ịha nhata” maka “ọdịmma nke ógbè ahụ dum.” Nrọ ha nke ụwa ziri ezi n’ụzọ omume na ezi ikpe maka onye ọ bụla—ụwa ezi ikpe—ò mezuwo?

Ọ bụ ezie na a na-ele Ọgbụgba Ndụ ahụ a bịanyere aka na ya n’ime Mayflower anya dị ka ntọala nke usoro gọọmenti America, ikpe na-ezighị ezi na-adịkarị n’America, ọbụna dị ka ọ dị gburugburu ụwa. Dị ka ihe atụ, tụlee maka otu nwoke onye uwe ojii gbara égbè ebe ọ na-agbalị ịgbalaga mgbe o zusịrị onye nwe otu ụlọ ahịa ohi, gbaakwa ya égbè. Ọ gbara ndị uwe ojii na obodo ukwu New York akwụkwọ ma nweta ọtụtụ nde dollar ná nkwụghachi ụgwọ.

Tụlee ihe atụ ọzọ. Ka ụmụ akwụkwọ na-amụ iwu na-ele ule isonye ná ndị ọkàiwu na Pasadena, California, otu n’ime ha dara wee tụbọọ. Ụmụ akwụkwọ abụọ nọ ya nso jiri usoro mweghachi iku ume mee ihe ngwa ngwa ruo mgbe ndị enyemaka n’ọrụ ahụ ike bịarutere. Ha ji minit 40 nyere nwoke ahụ aka. Ma mgbe ha rịọrọ ka e nyetụkwuo ha oge iji lechaa ule ahụ, onye isi ndị ọkàiwu jụrụ.

E nwekwara okwu banyere ntaramahụhụ maka ime mpụ. Onye nkọwa ọnọdụ akụ̀ na ụba bụ́ Ed Rubenstein na-eme ka ọ pụta ìhè na: “Ihe ka n’ọtụtụ n’ime mpụ adịghị akpata njide ma ọlị. A naghị ekpe ọtụtụ ndị e jidere ikpe. A na-atọhapụ ọtụtụ ndị ikpe mara. Ntaramahụhụ a tụrụ anya ya, n’echiche onye mpụ ahụ, bụ ihe pụrụ ime eme, ọ bụghị ihe e ji n’aka.” N’iji ihe ndekọ maka mwaba n’ụlọ mee ihe, ọ na-ekwubi na onye ga-awaba n’ụlọ mmadụ “ga-agbanarị ịtụ mkpọrọ n’ihe karịrị 98 pasent nke oge ndị ahụ.” Ịdị ala nke ihe ize ndụ nke inweta ntaramahụhụ na-eduga n’inwekwu mpụ na ndị mpụ metụtara.—Eklisiastis 8:11.

N’ọtụtụ ala ọnụ ọgụgụ ka nta bụ́ ndị ọgaranya na-abawanye ọgaranya ebe ìgwè ndị ogbenye na-enweta ikpe na-ezighị ezi nke ọnọdụ akụ̀ na ụba. Ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ na-ejupụta, mgbe ndị mmadụ nwere obere ohere iji mee ka ọnọdụ ha ka mma ma ọ bụ ọbụna ilekọta onwe ha n’ihi ụcha akpụkpọ ahụ, nzụlite agbụrụ, asụsụ, ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ma ọ bụ okpukpe ha. Dị ka ihe atụ, dị ka The New York Times si kwuo, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ijeri mmadụ na Ndịda Esia ndị Hindu bijupụtara—ihe ka n’ọtụtụ n’ime ha bụ n’India na Nepal—bụ ndị a na-amụ, ha na-anwụkwa dị ka osu.” Ihe nke a na-arụpụta bụ na ịda ogbenye, agụụ, na ọrịa na-awakwasị ọtụtụ nde ndị mmadụ. Ikpe na-ezighị ezi na-adị n’ogologo ndụ ha nile.

Gịnị banyere ikpe na-ezighị ezi ndị ahụ yiri ka ọ́ dịghị ihe mmadụ pụrụ ime banyere ha? Cheedị maka ụmụaka ndị na-enwe nkwarụ site n’ọmụmụ—ndị kpuru ìsì, nwee nsogbu ọgụgụ isi, ma ọ bụ ọrụsị? Ọ̀ bụ na nwanyị agaghị enwe echiche nke ikpe na-ezighị ezi ma ọ bụrụ na ọ mụpụtara nwa dara ngwụrọ ma ọ bụ nke nwụrụ anwụ ebe ndị inyom nọ ya gburugburu ku ụmụaka ahụ dị mma?

N’ụzọ dị mwute, ikpe na-ezighị ezi jupụtara ebe nile, otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ndị ọ na-akpata—oké ịta ahụhụ na enweghị udo, ọṅụ, na afọ ojuju. N’ịbụ ndị ikpe na-ezighị ezi ha na-ahụ ma ọ bụ na-enwe ahụmahụ ya na-akpasu iwe, ọtụtụ echigharịkwuruwo ime ihe ike, nanị itinye ihe n’ahụhụ ụmụ mmadụ. A lụwo ihe ka n’ọtụtụ agha n’ihi ikpe na-ezighị ezi nke a hụtara.

N’ihi gịnị ka mmadụ jiworo daa n’iweta ụwa ezi ikpe? Ụwa dị otú ahụ ọ̀ bụ nanị nrọ?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Corbis-Bettmann

[Foto dị na peeji nke 4]

Ịbịanye aka n’Ọgbụgba Ndụ “Mayflower”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Corbis-Bettmann

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya