Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/15 p. 32
  • Ná Nkwa Ònye Ka Ị Pụrụ Ịdabere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ná Nkwa Ònye Ka Ị Pụrụ Ịdabere?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/15 p. 32

Ná Nkwa Ònye Ka Ị Pụrụ Ịdabere?

NA 1893 otu ìgwè nke mmadụ 74 na-akọwa ihe banyere ọha mmadụ zukọrọ n’Ihe Ngosi Ụwa nke Chicago iji tụlee ọdịnihu. (E gosiri ebe e nwere ya n’elu.) N’ilepụ anya afọ 100 n’ihu gaa na 1993, ha buru amụma ndị na-esonụ tinyere ndị ọzọ: “Ọtụtụ ndị mmadụ ga-anọ ndụ ruo ịgba afọ 150.” “Ụlọ mkpọrọ ga-ebelata, a ga-elekwa ịgba alụkwaghịm anya dị ka ihe na-adịghị mkpa.” “Gọọmenti ga-abụ ihe dịkwu mfe, ebe ezi ịdị ukwuu na-abụkarị mgbe nile ịdị mfe.”

N’otu aka ahụ, na 1967 otu akwụkwọ a kpọrọ The Year 2000 buru amụma, sị: “Ka ọ na-erule afọ 2000, o yiri ka kọmputa ọ ga-emeru, ṅomie, ma ọ bụ mee ihe karịrị ụfọdụ n’ime ikike ọgụgụ isi mmadụ ndị kasị yie ‘nke ụmụ mmadụ,’ ikekwe na-agụnye ụfọdụ ikike ịchọ mma na ihe mmepụta ihe ya.” “Echiche nke iji ígwè ọrụ robot dị ọnụ ala na-arụ ihe ka n’ọrụ a na-arụ n’ụlọ . . . yikarịrị nke ezi uche dị na ya mgbe ọ na-erule afọ 2000.”

Ọhụhụ ihe a kpọrọ mmadụ na-apụghị ịhụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu dị nnọọ iche n’ụzọ dị ịrịba ama n’ikike Chineke. Dị ka ihe atụ, jiri amụma ndị a kpọtụrụ uche na mbụ tụnyere ihe Bible buru n’amụma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ 20 gara aga n’ihe banyere ụbọchị anyị: “Mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.”—2 Timoti 3:1-5.

Amụma a nke Bible banyere “mgbe ikpeazụ” bụ nanị otu n’ime ọtụtụ amụma ndị mezuworo n’oge anyị. Okwu Chineke buru amụma na “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ Jisọs ga-agụnye agha ụwa, oké ụnwụ, ajọ ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile.—Matiu 24:3-14; Luk 21:11.

Izi ezi na-adịghị ada ada nke nkwa Chineke kpaliri otu onye so dee Bible ikwu ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “Ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ezi ihe nile nke Jehova, bụ́ Chineke unu, kwuru banyere unu; ha nile emeworo unu, ọ dịghị otu ihe dapụrụ n’ime ya.”—Joshua 23:14.

Ee, anyị pụrụ ijide n’aka na nkwa Chineke nile ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Alaeze Chineke ga-eweta ọrịa, mpụ, ọgwụ iri mmadụ ahụ, agụụ, na agha ná njedebe—ụwa nile ga-abụ paradaịs. (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ị pụrụ ịdabere ná mmezu nke amụma a! O sitere n’ọnụ Onye Okike anyị onye “na-apụghị ikwu okwu ụgha.”—Taịtọs 1:2; tụlee Ndị Hibru 6:13-19.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie nke Mahadum Cleveland

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya