Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 9/1 p. 3
  • Oge Ihe Isi Ike Maka Ndị Agadi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Ihe Isi Ike Maka Ndị Agadi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-enyere Ndị Agadi Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-emeso Ndị Agadi?
    Teta!—2004
  • Ịsọpụrụ Ndị Nne na Nna Anyị Meworo Agadi
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 9/1 p. 3

Oge Ihe Isi Ike Maka Ndị Agadi

MAMA ONIYAN, onye dị afọ 68, bi n’otu obodo ukwu n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Mgbe ọ na-akatachabeghị ahụ, o chere echiche ibi ndụ oge agadi ya n’ezumike nká dị jụụ, bụrụ onye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya gbara gburugburu. Kama nke ahụ o ji oge ya nile na-ere mmiri ọṅụṅụ jụrụ oyi n’okpuru anyanwụ na-achasi ike. Ntakịrị ihe ọ na-akpata na-enyere ya aka ịnọgide na-adị ndụ. Ụmụ ya ndị nwoke abụọ bi n’obodo ọzọ dị anya. Ọ dịwo anya kemgbe ha ziteere ya ego ọ bụla.

N’oge gara aga, e ji ndị agadi nọ n’Africa kpọrọ oké ihe. A kwanyeere ha ùgwù maka ahụmahụ na ihe ọmụma ha, tinyere amamihe na nghọta ndị a na-ewetakarị. Ha nyere aka ịzụ ụmụ ụmụ. Ndị na-akatabeghị ahụ na-achọ ndụmọdụ na nkwado ha. Ndị mmadụ biri ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ Bible: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.”—Levitikọs 19:32.

Ụbọchị agbanweela. Ogbenye, ịrị elu nke ọnụ ahịa, enweghị ọrụ, na ịkwaga n’obodo ukwu n’ìgwè ahapụwo ọtụtụ ndị agadi ịkpara onwe ha nri. Onye ntụzi nke HelpAge Kenya, bụ́ Camillus Were, na-asị: “Ọdịnala nke ịkwado na ilekọta ndị agadi aghọwo ihe na-adalata adalata.”

N’ezie, ọ bụghị nanị ná mba ndị dị n’Africa ka e nwere ndakpọ nke nkekọ ezinụlọ. N’ikwu banyere Japan, Guardian Weekly na-akọ, sị: “Ịhụnanya nke ụmụ bụbu nkume bụ isi nke usoro àgwà ọma ndị Japan nke okpukpe Confucius hapụrụ, ma ọ lanarịbeghị mmepe obodo na ntọsa nke ihe nkekọ ezinụlọ: taa, 85 pasent nke ndị Japan na-anwụ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ebe nlekọta ndị agadi.”

N’agbanyeghị ihe ọnọdụ bụ, ndị chọrọ n’ezie ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-agbalị ịsọpụrụ nne na nna ha. Ha na-aṅa ntị na ndụmọdụ Bible: “Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ọ bụ ezie na ọ naghị adị mfe mgbe nile ịsọpụrụ na ilekọta ndị nne na nna meworo agadi, ọ pụrụ iweta ụgwọ ọrụ n’ụba.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya