Oge Ihe Isi Ike Maka Ndị Agadi
MAMA ONIYAN, onye dị afọ 68, bi n’otu obodo ukwu n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Mgbe ọ na-akatachabeghị ahụ, o chere echiche ibi ndụ oge agadi ya n’ezumike nká dị jụụ, bụrụ onye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya gbara gburugburu. Kama nke ahụ o ji oge ya nile na-ere mmiri ọṅụṅụ jụrụ oyi n’okpuru anyanwụ na-achasi ike. Ntakịrị ihe ọ na-akpata na-enyere ya aka ịnọgide na-adị ndụ. Ụmụ ya ndị nwoke abụọ bi n’obodo ọzọ dị anya. Ọ dịwo anya kemgbe ha ziteere ya ego ọ bụla.
N’oge gara aga, e ji ndị agadi nọ n’Africa kpọrọ oké ihe. A kwanyeere ha ùgwù maka ahụmahụ na ihe ọmụma ha, tinyere amamihe na nghọta ndị a na-ewetakarị. Ha nyere aka ịzụ ụmụ ụmụ. Ndị na-akatabeghị ahụ na-achọ ndụmọdụ na nkwado ha. Ndị mmadụ biri ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ Bible: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.”—Levitikọs 19:32.
Ụbọchị agbanweela. Ogbenye, ịrị elu nke ọnụ ahịa, enweghị ọrụ, na ịkwaga n’obodo ukwu n’ìgwè ahapụwo ọtụtụ ndị agadi ịkpara onwe ha nri. Onye ntụzi nke HelpAge Kenya, bụ́ Camillus Were, na-asị: “Ọdịnala nke ịkwado na ilekọta ndị agadi aghọwo ihe na-adalata adalata.”
N’ezie, ọ bụghị nanị ná mba ndị dị n’Africa ka e nwere ndakpọ nke nkekọ ezinụlọ. N’ikwu banyere Japan, Guardian Weekly na-akọ, sị: “Ịhụnanya nke ụmụ bụbu nkume bụ isi nke usoro àgwà ọma ndị Japan nke okpukpe Confucius hapụrụ, ma ọ lanarịbeghị mmepe obodo na ntọsa nke ihe nkekọ ezinụlọ: taa, 85 pasent nke ndị Japan na-anwụ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ n’ebe nlekọta ndị agadi.”
N’agbanyeghị ihe ọnọdụ bụ, ndị chọrọ n’ezie ime ihe na-atọ Chineke ụtọ na-agbalị ịsọpụrụ nne na nna ha. Ha na-aṅa ntị na ndụmọdụ Bible: “Sọpụrụ nna gị na nne gị . . . ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:2, 3) Ọ bụ ezie na ọ naghị adị mfe mgbe nile ịsọpụrụ na ilekọta ndị nne na nna meworo agadi, ọ pụrụ iweta ụgwọ ọrụ n’ụba.