Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 8/15 p. 32
  • Ha Guzosiri Ike n’Oge Mkpagbu Ndị Nazi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Guzosiri Ike n’Oge Mkpagbu Ndị Nazi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 8/15 p. 32

Ha Guzosiri Ike n’Oge Mkpagbu Ndị Nazi

NGUZOSI ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova n’atụghị egwu na Nazi Germany guzopụrụ nnọọ iche n’ebe nguzo chọọchị Krisendọm weere dị. Prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme bụ́ John Weiss kwuru nke a n’akwụkwọ ya bụ́ Ideology of Death. Ọ na-ede, sị:

“Na 1934 chọọchị Evangelical siri ọnwụ na ‘okpukpe Lutheran aghaghị ịnabata’ ndị Nazi, ma kelee ‘Onyenwe anyị Chineke’ maka inye ndị Germany ‘okwusịa o bie dị nsọ, nke a pụkwara ịtụkwasị obi.’ . . . Otu bishọp Protestant degaara ndị ụkọchukwu ya akwụkwọ, sị, ‘Chineke eziteworo anyị [Hitler].’” Weiss na-aga n’ihu, sị: “Chọọchị Metọdist nke Germany . . . kwenyeere Bishọp Dibelius na Hitler azọpụtawo Germany pụọ n’aka mgbanwe Bolshevik dị nso, na-eweta udo na nkwụsị ike . . . Chọọchị Mormon dụrụ ndị òtù ya ọdụ na iguzogide Hitler bụ ịda iwu ndị Mormon.” Ọ na-agbakwụnyekwa, sị: “A gwara ndị Katọlik na ọ bụ ọrụ dị nsọ irubere ọchịchị ọhụrụ ahụ isi, ọrụ a na-enweghị mgbe a kagburu ya ọbụna mgbe ndị ụkọchukwu matasịrị banyere ihe ọjọọ nile mere n’ebe ọwụwa anyanwụ.”

Ma gịnị banyere Ndịàmà Jehova? Prọfesọ Weiss mere ka ọ pụta ìhè na “dị ka otu ìgwè, nanị Ndịàmà Jehova guzogidere ndị Nazi.” A kpọchiri ọtụtụ puku n’ime ha, ka Prọfesọ Weiss gara n’ihu ikwu, “ma a gaara atọhapụwo Onyeàmà ọ bụla e zijere ogige ịta ahụhụ nanị site na ya ịbịanye aka n’otu akwụkwọ na-ajụ okwukwe ya.”

Banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova, Prọfesọ Weiss na-ekwu, sị: “Ihe nlereanya ha na-egosi mkpebisi ike pụrụ iche na ike dị ukwuu nke Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ nwere tupu ya aghọọ òtù e guzobere eguzobe, òkè ọ na-ekere n’usoro nke ọha na eze ewee rikpuo ọchịchọ ibi ndụ emebighị okwukwe. Dị ka otu pastọ Protestant dere banyere ha, ‘Ọ bụghị oké chọọchị ndị ahụ, kama ndị a e kwutọrọ ma kwaa emo bụ ndị buru ụzọ guzo ọtọ megide ọnụma nke mmụọ ọjọọ ndị Nazi ahụ, bụrụkwa ndị nwere obi ike ịgba mgba maka okwukwe ha.’”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya