Ụlọikpe Kasị Elu nke Connecticut Akwadoo Ihe Ndị Ruuru Onye Ọrịa
N’April 16, 1996, Ụlọikpe Kasị Elu nke Connecticut, U.S.A., kwadoro ihe ruuru Ndịàmà Jehova ịjụ mmịnye ọbara. Mkpebi a gbanwere mkpebi ikpe ụlọikpe nnwale nweburu.
N’August 1994, ọbara malitere ịgbasi Nelly Vega ike, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mgbe ọ mụsịrị nwa mbụ ya. Mgbalị ndị e mere ịkwụsị oruru ọbara ya enweghị isi. Ka ọnọdụ Oriakụ Vega dịwanyere njọ, ụlọ ọgwụ ahụ chọrọ inweta ikike ụlọikpe iji kwuo ka a mịnye ọbara. Oriakụ Vega eburuworị ụzọ bịanye aka n’akwụkwọ ntọhapụ nke na-enye ntụziaka na a gaghị enye ya ọbara ma ọ bụ ihe ọ bụla e nwetara site n’ọbara n’oge ọ nọ n’ụlọ ọgwụ, wee si otú ahụ na-atọpụ ụlọ ọgwụ ahụ n’ibu ọrụ ọ bụla maka ihe ndị pụrụ isi ná mkpebi ya pụta. Ka o sina dị, ụlọ ọgwụ ahụ rụrụ ụka na ịmanye mmịnye ọbara ga-abụ ime ihe maka ọdịmma kasị mma nke nwa ọhụrụ ahụ, bụ́ onye, ka ụlọ ọgwụ ahụ rụrụ ụka, chọrọ nne ya. Ụlọikpe nnwale ahụ nwekwara nchegbu na, e wezụga ọbara gbara ya, Oriakụ Vega bụ nwa agbọghọ ahụ dị mma. N’ihi ya, n’agbanyeghị mkpesa nke ma di Oriakụ Vega ma ọkàiwu ya mere, ụlọikpe ahụ nyere ikike ahụ, e wee mịnye ya ọbara.
Ka oge na-aga, e wetaara Ụlọikpe Kasị Elu nke Connecticut okwu ahụ. N’ebe ahụ, mmadụ nile kwekọrịtara na ihe ụlọ ọgwụ ahụ mere mebiri ihe ruuru Oriakụ Vega. Mkpebi ikpe ahụ sịrị: “Nnụrụ okwu ikpe e mere n’ụlọikpe nnwale ahụ weere ọnọdụ n’etiti abalị, n’okpuru ọnọdụ mberede ndị na-ekwesịghị ekwesị maka ikike ndị nke ọ bụla nwere iji kọwapụta arụmụka ya.”
Mkpebi ikpe a nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Connecticut dị ịrịba ama nye ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova. “Ọ dị mkpa nye ndị ọrịa nile ndị nwere ike ghara ikwenyere mkpebi ndị dọkịta ha,” ka Donald T. Ridley, bụ́ ọkaiwu Oriakụ Vega, na-ekwu. “Mkpebi ikpe ahụ ga-egbochi ụlọ ọgwụ dị iche iche igwepịa ụkpụrụ ndị ọrịa, ma ha bụ ihe metụtara okpukpe ma ọ bụ ọchịchị.”