Mgbe Ndịàmà Jehova Bịara
Gịnị ka ndị̀ Katọlik kwesịrị ime mgbe otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ebe obibi ha? Otu mbipụta ọhụrụ nke Ụlọ Ọrụ Ndị Katkist Na-ahụ Maka Nnọkọ Ndị Bishọp nke Mba Itali kwadebere na-ekwu, sị: “Iji obi ọma jụ inwe mkparịta ụka ma n’ụzọ siri ike, abụghị enweghị afọ ọma n’ọnọdụ a.”
Ọ bụghị ndị Katọlik nile kwere, dị ka otu akwụkwọ ozi otu nwoke bi na Foggia, Itali zijeere otu akwụkwọ akụkọ bụ́ Gazzetta del Mezzogiorno gosiri:
“Abụghị m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Abụ m onye Katọlik. Ma iwu ụfọdụ chọọchị na-ebokwasị ndị òtù ya na-eju m anya, na-agwa ha ka ha mapawa ozi ịdọ aka ná ntị n’ọnụ ụzọ ha iji na-achụla Ndịàmà Jehova. E kwuwerị, ọ bụ nanị Okwu Chineke ka ndị a na-ekwusa, ha na-enyekwara ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma Bible miri emi karị. Ọ na-echetara m oge mgbe ọgbụgbọ na ọnyụnyụ tiwapụrụ n’Itali, e wee nye anyị ndụmọdụ banyere otú anyị ga-esi zere ibute ya.
“N’echiche m, nke a na-egosi na chọọchị ji aka ike na-enye ụkpụrụ nduzi nke ya n’echebaraghị ọchịchọ nke ndị òtù ya echiche. Ma ruo afọ ụfọdụ ugbu a, ahụwo m na ọbụna ndị Katọlik na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eletakwa ebe obibi Ndịàmà Jehova; ha na-akpọbatakwa ha, soro ha na-enwe mkparịta ụka, n’ajụghị onye ọ bụla.”
Ndịàmà Jehova adịghị amanye ndị mmadụ ịnakwere ozi ha. Kama nke ahụ, ha na-agbalị isoro ndị ọzọ kerịta olileanya e setịpụrụ n’Okwu Chineke nke ha onwe ha hụworo na ọ na-akasi obi n’oge nsogbu ndị a. Site n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na site n’isoro ndị ha zutere n’okporo ámá kwurịta okwu, Ndịàmà Jehova na-esoro ndị dị njikere ige ntị ekerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14; Ọrụ 5:42; 17:17.