Ịkwụwa Aka Ọtọ—Ná Ndaba Ka Ọ̀ Bụ ná Nhọrọ?
“Ọ BỤ ezie na adịghị m enwe ọchịchọ ịkwụwa aka ọtọ, mgbe ụfọdụ ana m eme otú ahụ ná ndaba.” Otú ahụ ka agamevu ahụ bụ́ Autolycus kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Winter’s Tale nke William Shakespeare dere. Nke a na-enye ihe atụ nke otu adịghị ike gbara ọkpụrụkpụ nke mmadụ—ọchịchọ anyị nwere ime ihe ọjọọ, bụ́ nke na-esite ‘n’obi dị aghụghọ.’ (Jeremaịa 17:9; Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 5:12) Ma nke a ọ̀ na-apụta na anyị enweghị nhọrọ ọ bụla n’okwu ahụ? Ịkpa àgwà ọma ọ̀ na-eme nanị ná ndaba? Ọ dịghị ma ọlị!
Tupu ụmụ Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mosis gwara ha okwu mgbe ha mara ụlọikwuu n’ala dị larịị nke Moab. O debere nhọrọ abụọ doro anya n’ihu ha. Ha nwere ike irubere iwu Chineke isi ma nara ngọzi ya ma ọ bụ jụ ha ma ghọrọ mkpụrụ dị ilu nke mmehie. (Deuterọnọmi 30:15-20) Ọ dịrị ha ime nhọrọ.
Dị ka ndị nweere onwe ha ime nhọrọ, anyị nwekwara nhọrọ. Ọ dịghị onye—gụnyere Chineke—na-amanye anyị ime ihe ọma ma ọ bụ ime ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ ịjụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị, ‘Ọ bụrụ na obi anyị nwere ọchịchọ ime ihe ọjọọ, olee otú anyị pụrụ isi na-eme ihe dị mma?’ Dibịa ezé na-eji nlezianya enyocha ezé iji chọpụta nrichapụ ma ọ bụ ire ure tupu ọ gaa n’ihu gabiga ókè. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị anyị mkpa inyocha obi ihe atụ anyị iji chọpụta adịghị ike na ire ure nke omume. N’ihi gịnị? N’ihi na “n’obi ka ajọ echiche nile, igbu mmadụ nile, ịkwa iko nile nke ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di, ịkwa iko nile, ohi nile, àmà ụgha nile, nkwulu nile, si apụta,” ka Jisọs kwuru.—Matiu 15:18-20.
Iji chekwaa ezé, dibịa ezé aghaghị iwepụ kpam kpam ire ure ọ bụla a chọpụtara. N’otu aka ahụ, ime ihe ngwa ngwa dị mkpa iji wepụsịa “ajọ echiche nile” na ọchịchọ ọjọọ site n’obi. Site n’ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ọ bụghị nanị na anyị na-amara ụzọ Onye Okike anyị kama anyị na-amụtakwa ime ihe ziri ezi.—Aịsaịa 48:17.
Eze Devid nke Israel ji enyemaka dị mkpa o nwekwuru mee ihe n’ọgụ ọ lụrụ ime ihe ziri ezi. O kpere ekpere, sị: “Keere m obi dị ọcha, Chineke; meekwa ka mmụọ nke na-eguzosi ike dị ọhụrụ n’ime m.” (Abụ Ọma 51:10) Ee, site n’ịdabere na Jehova Chineke n’ekpere, anyị onwe anyị kwa pụrụ imeri ọchịchọ anyị ime ihe ọjọọ ma zụlite ‘mmụọ dị ọhụrụ’ ime ihe ọma. N’ụzọ dị otú a, anyị agaghị adị na-akwụwa aka ọtọ nanị ná ndaba. Ọ ga-abụ n’ihi na a họọrọ ya.
[Foto dị na peeji nke 21]
Dị ka n’ọnọdụ Devid, ikpegara Jehova ekpere pụrụ inyere anyị aka ime ihe ọma