‘Na Chineke Ka M Ga-agbaba’
‘N’OGE ndị a dị oké egwu,’ ọnwụnwa na nrụgide dị iche iche na-arịwanye elu. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ile ịkwụwa aka ọtọ anyị ule n’ebe ọrụ. A pụrụ ile ịdị ọcha anyị ule n’etiti ụmụ akwụkwọ ibe anyị. Ụwa rụrụ arụ n’ụzọ omume na-etinyekarị nguzosi ike n’ezi ihe anyị n’ule.—2 Timoti 3:1-5.
Onye so dee Bible bụ́ Esaf dịkwara ndụ n’oge ajọ omume rịrị ibe ya elu. Ọbụna ụfọdụ ndị ya na ha bikọrọ ndụ jiri àgwà asọpụrụghị Chineke ha tuo ọnụ. “Mpako dị ha gburugburu dị ka ịnyagba olu,” ka Esaf dere. “A na-ewere ime ihe ike kpuchie ha dị ka uwe. Ha na-akwa emo, na-ekwukwa okwu mmegbu n’ihe ọjọọ: ha na-esi n’ebe dị elu kwuo okwu.” (Abụ Ọma 73:6, 8) Omume a ọ̀ dara gị ka ihe na-eme eme?
Nye ndị nwere ọchịchọ ime ihe ziri ezi, àgwà dị otú ahụ na-akpata obi erughị ala, ọbụna na-akụda mmụọ. ‘M wee bụrụ onye a na-eti ihe ogologo ụbọchị nile,’ ka Esaf kwara n’arịrị. “Ndọgbu onwe m n’ọrụ ka ọ bụ n’anya m.” (Abụ Ọma 73:14, 16) Ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke ahụ, ma obi adala gị mbà! O kwere Esaf omume ịnagide ajọ omume nke oge ya, ị pụkwara ime otú ahụ. Ma n’ụzọ dị aṅaa?
Esaf bịara ghọta na ọ fọrọ nke nta ka ikpe ziri ezi bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume ịchọta n’okpuru ịchịisi nke mmadụ na-ezughị okè. (Abụ Ọma 146:3, 4; Ilu 17:23) Ya mere kama ịtụfusị oge, ume, na ihe onwunwe ya dị oké ọnụ ahịa n’ịgbalị iwepụsị ajọ omume nile gbara ya gburugburu, o legidere anya ná mmekọrịta ya na Chineke. Esaf kwupụtara, sị: “Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova.”—Abụ Ọma 73:28.
Taa, ndị na-ekere òkè n’omume achụmnta ego rụrụ arụ na-eritekarị uru ihe onwunwe. Ọtụtụ pụrụ ọbụna itu ọnụ maka anya ha na-eleghara iwu omume ọma nke Chineke. Ma ha agaghị anọgide ruo mgbe ebighị ebi. “N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka Ị ga-edo ha,” ka Esaf kwuru. “I mewo ka ha daruo ntikpọ.”—Abụ Ọma 73:18.
Ee, n’oge Chineke kara aka, a ga-ewepụ aghụghọ, ihe ike, na àgwà arụrụala, tinyere omume asọpụrụghị Chineke ndị ọzọ nile ezi ndị Kraịst na-aghaghị izere. Bible na-ekwe nkwa, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.” (Abụ Ọma 37:9) Ka ọ dị ugbu a, ka anyị kwughachi okwu ọbụ abụ ahụ onye sịrị: “Jehova bụ nkume m dị elu, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ; Ọ bụ Chineke m, na oké nkume m, ana m agbaba n’ime Ya.”—Abụ Ọma 18:2.