Iburu Yoke na Nwata
‘N’OGE ndị a dị oké egwu,’ ndị na-eto eto na-eche nrụgide dị ukwuu ihu. (2 Timoti 3:1) Kwa ụbọchị ha na-anụ ọtụtụ mgbasa echiche nke na-agba ume ime omume rụrụ arụ, ise siga, na ụdị akparamàgwà ndị ọzọ na-ebibi ihe. A pụrụ ịkwa ndị na-agbaso ụkpụrụ Bible emo n’ihi ịjụ ịgbaso ìgwè n’ime ihe ọjọọ, ndị Kraịst ụfọdụ pụkwara iche na ọ ga-aka mfe isonyere ha.
Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke narị afọ nke asaa T.O.A., Jeremaịa dere, sị: “Ọ dịịrị nwoke mma ka ọ na-ebu yoke na mgbe ọ dị na nwata.” (Abụ Ákwá 3:27) Gịnị ka o bu n’uche? Na ịmụta ịnagide ọnwụnwa na nwata na-enye aka ịkwadebe mmadụ iche ihe ịma aka nke oge dimkpa ihu. Ahụhụ, ọ bụ ezie na ọ dịghị enye obi ụtọ, bụ ihe ndị Kraịst ma ndị ntorobịa ma ndị meworo okenye na-apụghị ịgbanahụ. (2 Timoti 3:12) Ma abamuru nke ikwesị ntụkwasị obi karịrị nnọọ ahụ efe ọ bụla na-adịrụ nwa oge nke imebi okwukwe pụrụ iweta.
Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa, kwụrụ chịm izute ule dị iche iche nke okwukwe n’ụzọ ọ bụla. Mgbe a nwara gị itinye aka n’àgwà na-ezighị ezi, ekwela. Ọ bụ ezie na ka ọ dịgodị, ọ pụrụ isi ike ime nke a, ka oge na-aga, ị ga-enwe nchegbu dị ole na ole karị. Jisọs kwere nkwa, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, . . . unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:29, 30.
Nakwere ihe ịma aka nke ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Ime otú ahụ ga-enye gị ụzọ ndụ kasị mma ugbu a na olileanya e ji n’aka maka ọdịnihu. Dị ka Bible na-ekwu, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.