‘Ndị Na-akwụwa Aka Ọtọ Dị Anyị Mkpa’
Ịkwụwa aka ọtọ dị ụkọ n’ụwa taa. Ma, ọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ a chọrọ n’aka ndị Kraịst. Pọl dere, sị: “Anyị na-achọ [ịkwụwa aka ọtọ, NW] n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) nke a bụ ihe Wilma, otu n’ime Ndịàmà Jehova na Faenza, Itali, chọrọ ime.
Akwụkwọ akụkọ bụ́ Il Resto del Carlino na-akọ na mgbe ọ hụrụ otu pọọsụ ùkwú ego buru ibu dị n’ime ya n’èzí otu nnukwu ụlọ ahịa n’obodo ya, o nyefere ya ndị uwe ojii “n’egbughị oge” ka e wee nwee ike iweghachiri ya onye nwe ya.
Mgbe onye isi obodo nụrụ nke a, o zigaara Wilma ozi ekele dị mkpirikpi ozugbo. “N’aha Obodo a,” ka o dere, “eji m obi m na-ekele gị maka ihe ọma i mere. ndị ọma na ndị na-akwụwa aka ọtọ dị obodo ọma anyị bụ́ Faenza mkpa.”
Ma a matara omume ọma ma ọ bụ na a mataghị ha, anyị kwesịrị ịgbalị mgbe nile ịkwụwa aka ọtọ. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-agba ume, “anyị na-agbalị ime ezi ihe ọ bụghị nanị n’anya Chineke kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.”—2 Ndị Kọrint 8:21, The Jerusalem Bible.