Ịgbagha Ebubo Ụgha na France
NDỊÀMÀ JEHOVA na France n’isi nso a bụ ndị a wụkwasịrị ọtụtụ ebubo ụgha. N’iji ihe ọdachi ndị metụtara òtù okpukpe nzuzo na Europe na Japan eme ihe, usoro mgbasa ozi gbasara ihe ọmụma a gwagburu agwagbu banyere Ndịàmà. A kọwahiere ha dị ka otu n’ime òtù nzuzo ndị kasị ibu na ndị kasị dị ize ndụ.
Ná mgbalị ime ka okwu doo anya, Ndịàmà Jehova bipụtara otu traktị zara ajụjụ ndị dị ka ndị a: Olee ndị bụ Ndịàmà Jehova? Hà bụ ndị Kraịst? Hà na-anakwere nlekọta ọgwụ? N’ihi gịnị ka ha ji aga site n’ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ? Olee otú e si enweta ego maka ọrụ ha? Olee otú Ndịàmà Jehova si abara ógbè ha uru?
A kpọrọ traktị ahụ na-enye ihe ọmụma dị n’asụsụ French Jehovah’s Witnesses—What You Need to Know (Ndịàmà Jehova—Ihe Ọ Dị Gị Mkpa Ịma). Iji hapụrụ ọtụtụ mmadụ dị ka e nwere ike traktị ahụ, a haziri mkpọsa. Bido na May 13 ruo June 9, 1996, e kesara ihe karịrị nde itoolu.
Traktị a masịrị ọtụtụ mmadụ, gụnyere ndị ọrụ obodo. “Nkatọ a katọrọ Ndịàmà Jehova na-ewute m nke ukwuu,” ka onye òtù kansụl otu ógbè dere mgbe ọ gụsịrị traktị ahụ. “Ọtụtụ ugbo ọdịdị ọrụ unu nke obi ebere na achọghị ọdịmma onwe onye nanị amasịwo m.” Ná nzaghachi maka traktị ahụ, otu onye òtù nke Nzukọ Ndị Isi Europe dere, sị: “Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ maara nke ọma ụzọ isi mata ọdịiche dị n’etiti ìgwè ndị Kraịst unu so na ya na òtù nzuzo.”
Na Brittany otu Onyeàmà nyere otu ụkọchukwu traktị ahụ, bụ́ onye nakweere ya ozugbo. “Ana m aja unu ike maka ihe unu na-eme,” ka ụkọchukwu ahụ kwuru. Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere: “Ana m agba ndị parish m ume ịkpọbata unu n’ụlọ ha na inye unu otu iko kọfị. Ị pụrụ ọbụna ịgwa ndị ị ga-ezute na ị bịawo n’ụlọ m. Achọkwara m ịgwa gị na ọ na-amasị m ịgụ akwụkwọ unu.”
Mgbe ọ natasịrị otu traktị, otu nwoke bụ́ onye Protestant n’Alsace degaara Watch Tower Society akwụkwọ ka e duziere ya ọmụmụ Bible. “N’enwekwaghị obi ike ma ọlị na parish m,” ka o dere, “m na-elepụ anya maka mmalite ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ.” N’agbanyeghị ebubo ụgha ndị a na-ebo ha mgbe ụfọdụ, Ndịàmà Jehova na France—n’ezie, n’akụkụ nile nke ụwa—nọgidere na-enyere ndị mmadụ aka inweta ezi ihe ọmụma nke nzube Chineke, dị ka e setịpụrụ ha n’ime Bible.—2 Timoti 3:16, 17.