Hà Bụcha Mkpughe Chineke?
MMỤỌ Chineke, nke nyere ike e ji dee Bible Nsọ, ọ̀ pụkwara ịbụ ihe e ji dee akwụkwọ ndị ọzọ nke ụfọdụ na-ele anya dị ka ndị dị nsọ? (2 Timoti 3:16) E welitere ajụjụ a n’akwụkwọ ndị Jesuit Itali (La Civiltà Cattolica), nke e bipụtara “n’okpuru nlekọta nke Odeakwụkwọ Ọchịchị [Vatican]” wee si otú a bụrụ nke e weere dị ka okwuchaa obie n’etiti ndị Katọlik.
“Chineke, site n’ọrụ nke Mmụọ Nsọ, ghasara mkpụrụ nke Okwu ahụ ọbụna n’ụfọdụ akwụkwọ ndị dị nsọ nke ọdịnala na-abụghị nke ndị Juu na ndị Kraịst,” ka akwụkwọ ndị Jesuit ahụ kwuru. Nye ndị Jesuit, akwụkwọ ndị “dị nsọ,” dị ka Avesta nke ndị Zoroaster ọ bụ Akwụkwọ Anọ nke ndị Confucius, bụ ndị e dere “n’okpuru mmetụta ụfọdụ nke Mmụọ Nsọ, ya mekwara, n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ ha nwere ‘mkpughe Chineke.’”
Otú ọ dị, isiokwu ahụ mere ka otu ihe doo anya. “Ọ bụghị ihe nile dị n’ime akwụkwọ ndị ahụ dị nsọ bụ okwu Chineke,” ka ọ na-ekwu, na-agbakwụnye na ọ pụrụ ịbụ na ndị dere akwụkwọ ndị ahụ ‘enwewo mmetụta nke ebe a na-efe ọtụtụ chi ma ọ bụ n’ebe e nwere mmetụta nkà ihe ọmụma,’ bụ́ ebe ha biri ma rụọ ọrụ. Dị ka Marco Politi, onye nta akụkọ ihe na-eme na Vatican maka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica, si kwuo, nguzo a “na-eme ka e nwee mmekọrịta a na-apụghị ichebu n’echiche na ọ ga-ekwe omume n’etiti Chọọchị Katọlik na okpukpe ukwu ndị dị n’akụkọ ihe mere eme,” na-alọghachi na mmụọ nke nzukọ ekpere nke ngwakọta okpukpe dị iche iche dị ka nke ahụ e nwere n’Assisi na 1986, nke John Paul nke Abụọ ji ike kwalite.
Jehova abụghị Chineke nke adịghị n’usoro na ọgba aghara. (1 Ndị Kọrint 14:33) Ya mere anyị apụghị izi ezi n’ikwubi na mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya, ga-eme ka e dee ọbụna otu akụkụ nke akwụkwọ ọ bụla ndị na-ekwekọzughị n’Okwu ya, bụ́ Bible. Kama ịkwado inwe ngwakọta okpukpe n’etiti “ọdịnala okpukpe dị iche iche,” onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere na “otu olileanya . . . , otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe dị, otu baptism dị.”—Ndị Efesọs 4:4, 5.
“Otu olileanya” ahụ hiwere isi n’itinye okwukwe na Jisọs Kraịst. Bible na-ekwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.” (Ọrụ 4:12) Ọ dịghị “akwụkwọ dị nsọ” ọzọ kwuru banyere Jisọs dị ka onye bụ isi n’imezu nzube Chineke. Ọ gwụlakwa ma anyị nakweere Bible dị ka Okwu Chineke ka ọ pụrụ ịkụziri anyị banyere ndokwa ịhụnanya nke Jehova Chineke maka nzọpụta.—Jọn 17:3; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.