Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ
“ỤZỌ ya dị mfe, na-aga n’ihe kpọmkwem, ma dị obiọma ga-arụpụta ihe karịa otú a tụrụ anya. E dere isiokwu ya n’ụzọ na-agbagwojughị anya ma dị ụtọ nke na a ga-akwali onye ọ bụla nwere obi eziokwu, nke na-achọ ihe ikwu, sị, ‘N’ezie Chineke nọ n’etiti unu.’” (1 Ndị Kọrint 14:25) Otú ahụ ka otu n’ime Ndịàmà Jehova sitere Thailand kwuru mgbe ọ na-akọwa broshuọ ọhụrụ ahụ, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Watch Tower Society ewepụtawo ya ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” n’ime 1996/1997.
E mere broshuọ a dị 32 peji, nke nwere àgwà zuru ezu ịbụ usoro ọmụmụ Bible. Ọ na-emetụtazu ozizi ndị bụ isi nke Bible. Okwu e dere na ya dị mfe, dịkwa nkenke, na-akọwa n’ụzọ doro anya ihe Chineke na-achọ n’aka anyị. Ndị na-agụ ya ekwesịghị inwe ihe isi ike ịghọta ya. Olee otú ị pụrụ isi duzie ọmụmụ Bible na broshuọ ọhụrụ a?
Jiri ajụjụ ya mee ihe. E nwere ajụjụ ndị dị ná mmalite ihe ọmụmụ nke ọ bụla. N’ime akara ngebichi ndị na-esochi ajụjụ nke ọ bụla, ị ga-achọta nọmba nke paragraf ebe azịza ha dị. A pụrụ iji ajụjụ ndị a mee ihe dị ka ma ntụle bu ụzọ ma ntụleghachi na-enye aka izi ihe. Dị ka ihe atụ, ná mmalite nke ọmụmụ Bible ebe obibi, ị pụrụ ịjụ onye mmụta ajụjụ ndị ahụ iji mata ihe ọ ga-aza. Kama ịgbazi azịza ọ bụla na-ezighị ezi ozugbo ahụ, ị pụrụ ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ. Ná ngwụsị nke ihe ọmụmụ ahụ, i nwere ike ịlaghachi n’ajụjụ ahụ iji hụ ma onye mmụta ahụ ò nwere ike ịza ha ugbu a n’ụzọ kwekọrọ na Bible.
Sapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ. N’ihe ọmụmụ nke ọ bụla, a na-eji akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-enye nkwado na-esochi okwu ndị dị nkenke nke eziokwu Bible. Ebe ọ bụ na e zoro aka n’ihe ka ọtụtụ n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ, n’ehotaghị ha, ọ dị mkpa ịgba onye mmụta ahụ ume ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na Bible nke ya. Ịgụ na ịtụgharị uche n’Okwu Chineke dị ya mkpa tupu o nwee ike itinye ya n’ọrụ ná ndụ.—Joshua 1:8.
Kọwapụta foto ndị ahụ. E sere ọtụtụ foto na ihe osise n’ime broshuọ ahụ—ihe karịrị ihe osise 50 ná ngụkọta. E sere ndị a, ọ bụghị nanị maka ịma mma n’anya kamakwa dị ka ihe inyekwu aka n’izi ihe. Dị ka ihe atụ, ihe ọmụmụ abụọ ikpeazụ (otu peji n’otu n’otu, na peji cherịtara onwe ha ihu) nwere isiokwu bụ “Inyere Ndị Ọzọ Aka Ime Uche Chineke” na “Mkpebi Gị Ijere Chineke Ozi.” Foto ndị gbasazuru peji abụọ ahụ gbasoro ọganihu ime mmụọ otu onye ahụ, na-egosi ya ka ọ na-agba àmà mberede, na-ekere òkè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, ime nraranye ya, na n’ikpeazụ ịbụ onye e mere baptism. Site n’ịdọrọ uche onye mmụta ahụ gaa na foto ndị a, ị na-enyere ya aka ịhụ nzọụkwụ ndị a chọrọ iji jeere Chineke ozi.
Gịnị ma ọ bụrụ na onye nwere mmasị adịghị agụ ihe nke ọma ma ọ bụ na o nweghị ike ịgụ ihe ma ọlị? Society na-emepụta broshuọ ọhụrụ a na kaseti a na-egere egere n’ọtụtụ asụsụ. Kaseti ahụ nwere ihe odide nke broshuọ ahụ gụnyere ọtụtụ n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ e zoro aka na ha. E tinyere ya na tepu n’ụzọ na-esonụ: A na-agụ ajụjụ nke mbụ, paragraf (ma ọ bụ ihe karịrị otu paragraf) ndị na-aza ya na-esochi, gụnyere ụfọdụ n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Mgbe ahụ a na-agụpụta ajụjụ na-esonụ, ihe odide na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-aza ya na-esochi, wee dịrị gawa. Onye mmụta ahụ pụrụ ịdị na-egere tepu ahụ ka ọ na-akwadebe maka ọmụmụ ihe ahụ. A pụkwara iji kaseti ahụ mee ihe mgbe a na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ.
Ndị bịara mgbakọ ahụ nwere oké mmasị iji broshuọ ọhụrụ a mee ihe n’ozi ubi ha. Dị ka ihe atụ, n’ime nanị ụbọchị ole na ole mgbe ha natasịrị broshuọ ahụ, ndị ọsụ ụzọ abụọ (ndị na-ezisa ozi ọma oge nile) sitere United States tinyere ya n’aka di na nwunye na-akatabeghị ahụ bụ́ ndị ha nọworo na-akpọtụrụ. Mgbe di na nwunye ahụ lere anya n’ihe ndị dị n’ime ya, ihe ọmụmụ bụ́ “Omume Ndị Chineke Kpọrọ Asị” dọọrọ mmasị ha. “Ana m echebu mgbe nile na Chineke apụghị ịkpọ ihe asị—ọ bụ nanị ịhụnanya,” ka nwa agbọghọ ahụ kwuru. “Nke a ka m na-aga ibu ụzọ gụọ.” Mgbe ndị ọsụ ụzọ abụọ ahụ gaghachiri n’izu na-eso ya, nwa agbọghọ ahụ sịrị: “Anọ m na-agụ broshuọ ọhụrụ ahụ. O siri oké ike ime ihe nile anyị kwesịrị ime. Jehova enweghị obi ụtọ n’ebe anyị nọ—anyị abụghị di na nwunye. Ma anyị emewo mkpebi. Anyị emewo ndokwa ịlụ na Friday na-abịanụ.” N’ịmakụ di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ, ha gbakwụnyere, sị: “Anyị na-arịọ mgbaghara n’ihi adịghị enwechi ọmụmụ ihe ahụ anya, ma nke a bụ oké ibu arọ na-apụ n’ahụ anyị.”
N’ụzọ nile o kwere mee, jiri broshuọ Na-achọ ọhụrụ a mee ihe. Ọ bụ ngwá ọrụ ọma iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe Chineke na-achọ.
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Olee otú ị ga-esi jiri broshuọ ọhụrụ a mee ihe?