Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 1/1 p. 32
  • Ònye Ka A Ga-ata Ụta Maka Agha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ka A Ga-ata Ụta Maka Agha?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 1/1 p. 32

Ònye Ka A Ga-ata Ụta Maka Agha?

À GA-ATA Chineke ụta maka agha ndị ihe a kpọrọ mmadụ lụworo? “Ee e, Chineke achọghị agha.” Otú a ka Martin Niemöller, onye ụkọchukwu Protestant a ma nke ọma bụ́ onye Germany, si zaa ajụjụ a nwa mgbe nta mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị. E bipụtara okwu ya na 1946 n’akwụkwọ a kpọrọ Ach Gott vom Himmel sieh darein—Sechs Predigten (Oo Chineke, Si n’Eluigwe Lee Anya—Ozizi Isii).a Akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị:

“Onye ọ bụla chọrọ ịta Chineke ụta maka [agha] amaghị, ma ọ bụ achọghị ịma, Okwu Chineke. Otú ọ dị, ma a ga-ata anyị bụ ndị Kraịst ụta dị ukwuu maka agha ndị a nọgideworo na-alụ ma ọ bụ na a gaghị bụ ihe ọzọ. Anyị apụghịkwa ịgbanarị ajụjụ a n’ụzọ dị nnọọ mfe. . . . A pụkwara icheta n’ụzọ ziri ezi na, n’ime ọgbọ nile, chọọchị dị iche iche nke ndị Kraịst enyefewo onwe ha ugboro ugboro n’ịgọzi agha, ndị agha, na ngwá agha, ha ekpewokwa ekpere n’ụzọ na-abụtụghị nke ndị Kraịst maka mbibi nke ndị iro ha n’agha. Ihe a nile sicha anyị n’aka, o sikwa ndị nna anyị hà n’aka, ma a gaghị ata Chineke ụta ma ọlị. Ihere ga-emekwa anyị bụ́ ndị Kraịst nke taa n’ihu ndị ahụ a kpọrọ iro òtù dị ka Ndị Na-amụsi Bible Ike [Ndịàmà Jehova], bụ́ ndị gara n’ogige ịta ahụhụ n’ọtụtụ narị na ọtụtụ puku ma [ọbụna] nwụọ n’ihi na ha jụrụ ije ozi n’agha, jụkwa ịgbagbu ndị mmadụ.”

Taa, ihe dị ka afọ 50 mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, okwu Niemöller na-enye ndị hụrụ udo n’anya ihe ha ga-echebara echiche. Ee e, ọ bụghị Chineke ka a ga-ata ụta maka mwụfu ọbara nke mba nile! N’ezie, site n’ọnụ ndị na-efe ya ezi ofufe, bụ́ ndị na-adịghị etinye aka n’agha nke ụwa, Chineke na-akpọsa ọgwụgwụ dị nso nke agha nile.—Abụ Ọma 46:9; Jọn 17:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a E mesịrị bipụta ozizi Martin Niemöller na Bekee n’akwụkwọ bụ́ Of Guilt and Hope. Otú ọ dị, mbipụta nke Bekee dị iche n’ihe odide German mbụ, ya mere a sụgharịtara nhota a kpọmkwem site na nke German.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

USAF photo

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya