Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 12/15 p. 32
  • Abamuru nke Obi Dị Jụụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Abamuru nke Obi Dị Jụụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 12/15 p. 32

Abamuru nke Obi Dị Jụụ

Ọ DỊWO anya sayensị ọgwụ na ahụ ike ọgbara ọhụrụ matara na iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-enwe mmetụta na-ebibi ebibi n’ahụ mmadụ. Ihe karịrị otu narị afọ gara aga, akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association (JAMA) kwuru, sị: “Mmadụ dara nwụọ n’oké iwe, ikekwe a na-ekwukwa na o nwere obi na-adịghị ike, bụ́ nke na-apụghị ịnagide nrụgide nke ọnọdụ uche ya tụkwasịrị ya. O yighị ka ọ dị onye na-eche na nke a bụ nanị njedebe nke ogologo usoro nke ụdị oké iwe ahụ, bụ́ ndị kpataworo adịghị ike ahụ a na-ekwu okwu ya n’onwe ha.”

Okwu ndị ahụ dị n’elu abụghị ihe ijuanya nye ndị na-amụ Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ihe dị ka narị afọ 29 tupu JAMA ekwulite okwu banyere ihe ize ndụ nke iwe ọkụ, e nyere Eze Solomọn ike mmụọ nsọ ide: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Okwu ndị a ka bụkwa eziokwu taa.

Site n’ịnọgide na-enwe omume dị jụụ, a na-eme ka anyị zere ọtụtụ nrịanrịa ndị a na-ejikọtakarị ha na nchekasị, dị ka ọbara mgbalị elu, isi ọwụwa, na nsogbu iku ume. Otú ọ dị, tinyere ahụ ike ka mma, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ga-erite uru ma ọ bụrụ na anyị agbalịa “haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) A na-adọtakarị ndị mmadụ n’ebe Jisọs nọ n’ihi ịdị nwayọọ n’obi na nchegbu ya sitere n’obi maka ndị ọzọ. (Mak 6:31-34) N’otu aka ahụ, anyị ga-abụ isi iyi nke izu ike nye ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị azụlite obi dị jụụ.—Matiu 11:28-30.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya