“Oleekwanụ Ebe Chọọchị Unu Dị?”
ANA-AJỤKARỊ Ndịàmà Jehova nọ na Mozambique ajụjụ a. N’eziokwu, ruo na nso nso a ọ bụrụwo ajụjụ tara akpụ ịza. Nke a bụ n’ihi na Ndịàmà Jehova enweghị nnakwere dị ka iwu si dị ná mba a ruo 1991. N’ihi ya, o kweghị omume inwe ebe ofufe ndị doro anya na ndị a ga-amata nke ọma.
Otú ọ dị, ọnọdụ ahụ gbanwere na February 19, 1994. N’ụbọchị ahụ na-ekpo ọkụ, nke anwụ na-amụ, a raara Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ ndị mbụ e wuworo na Mozambique nye. Ngụkọta nke mmadụ 602 bịara nraranye nke ebe nzukọ ndị a mara mma n’obodo ukwu ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Beira, ihe dị ka ọkara ụzọ ma a na-aga ụsọ oké osimiri nke Mozambique. Ha ga-egbo mkpa nke ọgbakọ atọ dị n’obodo ukwu ahụ.
Ọrụ ahụ nile, malite n’ịtọ ntọala ruo n’iwucha ihe owuwu ndị ahụ, were otu afọ na ọnwa abụọ nke ịrụsi ọrụ ike. Mgbe mgbe ndị ọrụ afọ ofufo 30 ma ọ bụ karịa ndị sitere ná mba agbata obi ya bụ Zimbabwe bịara wee soro Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ rụkọọ ọrụ. Ebe ọ bụ na ọ bụghị ha nile ka a pụrụ inye ụlọ n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị na Beira, bụ́ ebe jere ozi dị ka ebe a na-esi ahazi ọrụ ahụ, ụfọdụ biri n’ụlọikwuu dị gburugburu ebe obibi ahụ ná ngwụsị izu na n’oge ụfọdụ ruo ọtụtụ izu n’otu mgbe.
Ebe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze maka Ọgbakọ Massamba na Ọgbakọ Munhava dị n’okporo ụzọ bụ isi nke Beira. “N’ụbọchị ọrụ ahụ kworo ekwo, mgbe ọrụ ahụ gara ngwa ngwa, a na-ahụkwa ọganihu ya,” ka otu onye ozi ala ọzọ kwuru, “anyị hụrụ mgbe ọ fọrọ nke nta ka ihe ọghọm mee ka ndị ọkwọ ụgbọala na-agbafenụ nọ na-ele Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, na-afọ nke nta ka ha chezọọ na ha na-anya ụgbọala.” Ọtụtụ kwụsịrị ikiri ọrụ ahụ, ọnụnọ nke agbụrụ dị iche iche na-arụkọ ọrụ ọnụ dị ka otu ndị masịrị ha karịsịa.
Ịtụ ụkpụrụ na nhazi dị ukwuu bara n’ọrụ ahụ. N’adịghị ka ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ dị n’akụkụ a nke ụwa, ebe ihe ọrụ na ihe onwunwe dị ụkọ, ọrụ a na-arụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ahụ akwụsịghị n’ihi ụkọ ihe ọrụ. N’otu oge, a chọrọ akpa siment 800, nanị otu ebe pụrụ inye ya enweghị akpa ndị dị mkpa iji wụnye siment ahụ. Ụmụnna kpọtụụrụ alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị n’isi obodo, bụ́ Maputo; e ji ụgbọelu bute akpa, buga ha n’ụlọ ọrụ na-emepụta siment, ma wụjuo ha. Ọrụ ahụ gara n’ihu n’akwụsịghị akwụsị.
N’oge ọzọ, mgbe a na-akụ ohiere elu ụlọ ndị ahụ, ntụhie ígwè gwụnahụrụ ndị ọrụ. N’ihi oké ụkọ, e siwo ebe dị 600 kilomita bubata ígwè maka ọrụ ahụ! Otu onye n’ime ndị ọrụ ahụ bịakwutere otu nwoke nọworo na-ekiri ihe na-emenụ ma jụọ ya ma ọ maara ebe ha nwere ike ịchọta ígwè iji rụchaa ọrụ ahụ. Nwoke ahụ zara: “Akwụrụwo m ebe a ruo otu hour, ọ gaghị abụworị ná ndabara. Ọ dịghị ihe m ga-eme n’abụghị inwe mmasị n’ọrụ unu na-arụ na mmụọ nke ọrụ a. Enwere m nnọọ ụdị ígwè unu chọrọ, ọ ga-atọkwa m ụtọ inye unu ya dị ka onyinye.” O mesịrị bụrụ onyinye kasị bịa n’oge.
Ọtụtụ ndị na-ahụ ihe na-emenụ na-eche ụdị ụlọ ọrụ ihe owuwu dị ukwuu na-arụ ọrụ ahụ. Otú ọ dị, ndị ọrụ ahụ nwere obi ụtọ dị ukwuu ịgwa ha na ndị a bụ Ndịàmà Jehova na-enyefe ozi ha n’afọ ofufo. Gịnị metụrụ ndị a na-ahụ ihe na-emenụ n’obi karịsịa? “Unu bụ ndị dị n’otu,” ka otu onye kwuru. “Ọ bụ ezie na unu sitere n’agbụrụ dị iche iche, unu na-arụkọ ọrụ ọnụ ka ụmụnne.” Ihe ọ rụpụtara bụ na ọtụtụ bịara na-arịọ ka e duziere ha ọmụmụ Bible. O metụtawokwa nzukọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, nkezi ndị na-abịa nzukọ nke Ọgbakọ Manga karịrị ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà okpukpu abụọ.
Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ndị ahụ n’ezie ghọrọ ngọzi dị ukwuu nye Ndịàmà nọ n’ógbè ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ezukọbuwo n’ebe ndị dị ochie ndị e ji ahịhịa mee elu ha ma ọ bụ jiri zink ole na ole tụchie elu ha, n’azụ ụlọ, ma ọ bụ n’ọnụ ụlọ nta nke ebe obibi mmadụ. Mgbe mgbe ahụ ha na-ede mmiri mgbe mmiri zoro; ma ha ji ikwesị ntụkwasị obi gaa nzukọ. Ruo ọtụtụ iri afọ ndị a bụ nanị “Ụlọ Nzukọ Alaeze” nke Ndịàmà nọ na Mozambique maara. Nwanna Caetano Gabriel, okenye n’Ọgbakọ Massamba, kwuru, sị: “Anyị na-ekele ụmụnna anyị gburugburu ụwa bụ́ ndị nyere onyinye maka iwuzu ihe owuwu a.” Otu Onyeàmà na-eto eto chetara: “Mgbe anyị nọ na Carico (“ogige nzigharị ihe” ebe e jichiri Ndịàmà Jehova ruo ihe dị ka afọ 12), anyị na-asịbu, ‘Anyị ga-anọgidesi ike n’ikwesị ntụkwasị obi, Jehova ga-enyekwa anyị ụgwọ ọrụ.’ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ahụ bụ ụgwọ ọrụ sitere n’aka Jehova.” Okwu ha na-egosipụta ekele dị ukwuu na mkpebisi ike ha inye Jehova otuto.
Ọtụtụ ndị ntorobịa ndị keere òkè n’ọrụ owuwu ihe ahụ bụ ndị a kụbara mmụọ ịsụ ụzọ n’ime ha, mgbe e mesịkwara, ha weere ozi ọsụ ụzọ oge nile. Isabel na-eto eto, onye ọsụ ụzọ oge nile nọ n’Ọgbakọ Manga, kwuru ka ọ na-ele anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ dị ọcha nke ukwuu ụbọchị bu nraranye ya ụzọ, sị: “Nye m nke a bụ ebe kasị mma n’obodo Beira. Ọ bụ ihe obi ụtọ kasị ukwuu nye m ịnọ n’ebe a.” Adão Costa, onye ozi ala ọzọ, kọwara na ndị ọchịchị nke ógbè ahụ enyewo nkwado kasịnụ n’ikwe ka e nwee usoro pụrụ iche nke mbubata ihe n’ihi na ha maara ịkwụwa aka ọtọ nke Ndịàmà. Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere: “Ọ bụ ezie na ezigbo ike gwụrụ anyị, ọ bụ ihe ọṅụ ịhụ mkpụrụ nke ọrụ a nile nye nsọpụrụ na otuto nke Jehova.”
Ugbu a, mgbe ọ bụla onye nwere omume enyi nke bi n’obodo Beira jụrụ, “Oleekwanụ ebe chọọchị unu dị?” Ndịàmà na-egosi ya otu n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ ọhụrụ ahụ ma zaghachi n’okwu ndị dị ka, “Ọ dị n’International Road, Avenida Acordo de Lusaka, kpọmkwem n’akụkụ nke ọzọ ma i site na Fourth Squadron Police Station.” Mgbe ahụ, na-agbakwụnye otu mgbazi olu, “Nanị na ọ bụghị chọọchị. Ọ bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze!”
[Map/Foto dị na peeji nke 20]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
AFRICA
Mozambique
Beira
Maputo
[Ebe E Si Nweta Foto]
Map: Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.