Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
A Kwụghachi Iwere Nguzo Siri Ike n’Ụlọ Akwụkwọ Ụgwọ Ọrụ
BIBLE na-ebu amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) N’ụzọ a gbasapụrụ agbasapụ, a pụrụ iji “ụmụ gị nile” mee ihe n’ebe ìgwè ndị ohu Chineke nile nọ n’elu ụwa nọ, tinyere ụmụntakịrị. Taa, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-eji n’aka na ụmụ ha bụ “ndị mmụta Jehova” n’ebe obibi na ná nzukọ ndị Kraịst.
Otú ọ dị, mgbe ha na-aga akwụkwọ, ihe ịma aka ndị siri ike na-eche ndị Kraịst na-eto eto ihu. Mgbe mgbe ha na-ahụ ya dị ka ihe dị ha mkpa iwere nguzo siri ike nke dabeere n’ihe ha mụtaworo na Bible. Mgbe ha mere ya, ihe ndị ọ na-arụpụta pụrụ ịbara ụmụ akwụkwọ nakwa ndị nkụzi uru, dị ka ahụmahụ na-esonụ nke sitere Micronesia na-egosi.
Ná ntakịrị àgwàetiti ọdịda anyanwụ Pacific bụ́ Tol nke dị n’Àgwàetiti Chuuk nile, ndị nkụzi nọ n’ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè ahụ gwara ụmụaka nile ka ha kwadebe ma kere òkè n’ememe Halloween nke ụlọ akwụkwọ. Ụmụ akwụkwọ bụ́ Ndịàmà maara na ememe ahụ pụrụ ịgụnye ịchọ mma na ejiji ndị na-egosipụta ndị mmụọ, ndị mmụọ ọjọọ, na ndị amoosu—ndị e jikọchara ha na ọdịnala mgbaasị. Akọ na uche ụmụaka a apụghị ikwe ha kere òkè.a
Site n’ọzụzụ dabeere na Bible nke ha nwetara n’ebe obibi na n’ọgbakọ ndị Kraịst, ha maara na ụdị omume ndị ahụ adịghị atọ Chineke ụtọ, ọbụna mgbe e mere ha nanị maka ntụrụndụ. Iji nye aka ịkọwa nguzo ha n’ụzọ doro anya karị, ụmụaka ahụ kpọrọ Barak òkù, bụ́ otu n’ime ndị ozi ala ọzọ bụ́ Onyeàmà n’àgwàetiti ahụ, ịgwa ndị nkụzi ha okwu.
Mgbe ha nụsịrị nkọwa ahụ, ndị nkụzi ahụ mere ndokwa maka nzukọ nke abụọ ebe Barak pụrụ ịgwa ndị ọrụ ụlọ akwụkwọ ahụ nile okwu. Ná nzukọ a, Barak kwuru ihe ndị bụ eziokwu iji gosi ihe Halloween bụ n’ezie. O nwetara ihe ọmụma ya site ná mbipụta ụfọdụ nke Watch Tower nakwa site n’ebe ndị ọzọ. Ndị nkụzi na ndị nlekọta nwere ihe ijuanya n’ihe ha mụtara banyere mmalite, akụkọ ihe mere eme, na ọdịdị okpukpe nke ememe ahụ. Ha kpebiri inwe nzukọ ndị ọrụ iji kpebie otú a ga-esi dozie ọnọdụ ahụ.
Ụbọchị ole na ole ka nke a gasịrị, a mara ọkwa mkpebi a na-atụghị anya ya. A na-akagbu nkwadebe nile maka Halloween. Ụlọ akwụkwọ ahụ agaghị nnọọ eme ememe Halloween n’afọ ahụ. Lee ihe dị mma mkpebisi ike ime ihe ziri ezi n’ụlọ akwụkwọ nke Ndịàmà a na-eto eto rụpụtara! Ọ dịghị mkpa ka ndị na-eto eto tụọ egwu ma ọ bụ mee ihere iwere nguzo doro anya maka eziokwu Bible.
Gburugburu ụwa, Ndịàmà Jehova na-akụziri ụmụ ha ịrụsi ọrụ ike n’ụlọ akwụkwọ. A na-azụkwa Ndịàmà na-eto eto ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible na isoro ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ kerịta olileanya na nkwenkwe ha mgbe ha nwere ohere ya. Ọbụna mgbe ihe ọ rụpụtara na-adịchaghị mma ma ọ bụ na-abịaghị ozugbo dị ka o mere n’ọnọdụ a, ndị ntorobịa pụrụ inwe obi ike na afọ ojuju nke na-abịa site n’ime ihe ziri ezi. Nke kakwa mkpa, ha pụrụ ijide n’aka na Nna ha nke eluigwe nwere obi ụtọ, ọ ga-agọzikwa ha maka nrubeisi n’ikwesị ntụkwasị obi ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere Halloween na mmalite mgbaasị ya, lee mbipụta Teta! nke December 8, 1993, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara.