“Onyinye Dị Ebube Sitere n’Aka Jehova”
MBIPỤTA Ụlọ Nche nke May 1, 1996, nwere ntụle dị omimi nke nnọpụiche ndị Kraịst na ụzọ isi hazie ibu ọrụ anyị n’ebe Jehova na “Siza” nọ. (Matiu 22:21) A nụwo ọtụtụ okwu ekele maka ihe ọmụma ọhụrụ ahụ e nyere. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ ozi na-esonụ, nke Onyeàmà nọ na Gris degaara Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova:
“Achọrọ m ikwupụta ekele m kasị omimi nye unu ụmụnna nile anyị hụrụ n’anya maka ilekọta anyị nke ọma otú a n’ụzọ ime mmụọ. Ebe m nọworo ihe ruru afọ itoolu n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe m nke ndị Kraịst, enwere m mmasị n’ezie n’echiche ndị dị ebube dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 1996. (Aịsaịa 2:4) Nke a bụ onyinye dị ebube sitere n’aka Jehova.—Jemes 1:17.
“Ka m nọ na-agụ isiokwu ndị a, echetara m otu okwu dị n’Ụlọ Nche bu ụzọ (August 1, 1994, peji nke 14): ‘N’ụzọ doro anya, ezi uche bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa, otu nke na-akwali anyị ịhụkwu Jehova n’anya.’ Ee, ụmụnna, ana m ekele Jehova na m bụ akụkụ nke nzukọ ya nwere obiọma, nke na-ahụ n’anya, nke na-egosipụta amamihe ya n’ụzọ doro anya.—Jemes 3:17.
“A nabatawo ìhè mụbara amụba dị n’Ụlọ Nche nke May 1 nke ọma n’ebe a na Gris, karịsịa nye ndị nọworo ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ ndị ka nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Ọzọkwa, unu emeela. Ka Jehova jiri mmụọ ya wusie unu ike ịnọgide na-enye anyị nri ime mmụọ bara uru n’oge ndị a jupụtara ná nsogbu.”