“Jehova Zakwara Ekpere M!”
N’ỤWA nile, Ndịàmà Jehova na-eduziri ndị nwere mmasị inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ọmụmụ Bible ebe obibi ise. Ọbụna ụmụaka nọ n’etiti Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ a. Dị ka ihe atụ, tụlee nwa okorobịa aha ya bụ Joel. O gosipụtara nraranye ya nye Jehova ma bụrụ onye e mere baptism mgbe ọ dị afọ itoolu. Otu afọ n’ihu o nwere ahụmahụ a:
“Mgbe m nọ n’ozi, ezutere m otu nwanyị aha ya bụ Candy. Enyefere m ya broshuọ bụ́ ‘Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ.’ O nweelarị ya, ya mere enyefere m ya akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. O nwekwalarị nke ahụ. Mgbe ahụ echere m, sị, ‘M ga-agwa nwanyị a ka m duziere ya ọmụmụ Bible.’ Ọ nakweere ya!
“Nwanne nwanyị Candy, bụ́ onye nọ n’ọnụ ọnwụ n’ihi ọrịa cancer, bịara ibinyere ya. Ọzọkwa, Candy na-amụ ihe iji bụrụ nọọsụ. Ya mere ruo oge ụfọdụ, a kwụsịrị ọmụmụ Bible ahụ. Ma mụ na ndị mụrụ m nọgidere soro ya na-enwe mkpakọrịta site n’ịhapụrụ ya ma ọ bụ di ya, bụ́ Dick, magazin. Ọ gwara anyị na ya na-edebe magazin ndị ahụ n’akụkụ ihe ndina ya ma na-agụ ha n’abalị.
“N’ikpeazụ, nwanne nwanyị Candy nwụrụ. Mụ na papa m na mama m gwara Candy okwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. O kpebiri ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ya. N’ụbọchị dị iche, anyị jụrụ Dick ma ọ ga-achọ isoro Candy mụọ ihe ma mee ya ọmụmụ ihe ezinụlọ. O chere na nke ahụ bụ ihe dị mma. Ya mere ugbu a, n’isonyere papa m, m na-eduziri ma Dick ma Candy ọmụmụ ihe. Ha na-enwe ọganihu dị mma ma na-ekwupụta ekele ha maka ọmụmụ Bible ahụ.
“Anọwo m na-ekpe ekpere maka ọmụmụ Bible, Jehova zakwara ekpere m!”