Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 10/15 p. 32
  • “Jehova Zakwara Ekpere M!”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Jehova Zakwara Ekpere M!”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 10/15 p. 32

“Jehova Zakwara Ekpere M!”

N’ỤWA nile, Ndịàmà Jehova na-eduziri ndị nwere mmasị inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ọmụmụ Bible ebe obibi ise. Ọbụna ụmụaka nọ n’etiti Ndịàmà Jehova na-ekere òkè n’ọrụ a. Dị ka ihe atụ, tụlee nwa okorobịa aha ya bụ Joel. O gosipụtara nraranye ya nye Jehova ma bụrụ onye e mere baptism mgbe ọ dị afọ itoolu. Otu afọ n’ihu o nwere ahụmahụ a:

“Mgbe m nọ n’ozi, ezutere m otu nwanyị aha ya bụ Candy. Enyefere m ya broshuọ bụ́ ‘Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ.’ O nweelarị ya, ya mere enyefere m ya akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. O nwekwalarị nke ahụ. Mgbe ahụ echere m, sị, ‘M ga-agwa nwanyị a ka m duziere ya ọmụmụ Bible.’ Ọ nakweere ya!

“Nwanne nwanyị Candy, bụ́ onye nọ n’ọnụ ọnwụ n’ihi ọrịa cancer, bịara ibinyere ya. Ọzọkwa, Candy na-amụ ihe iji bụrụ nọọsụ. Ya mere ruo oge ụfọdụ, a kwụsịrị ọmụmụ Bible ahụ. Ma mụ na ndị mụrụ m nọgidere soro ya na-enwe mkpakọrịta site n’ịhapụrụ ya ma ọ bụ di ya, bụ́ Dick, magazin. Ọ gwara anyị na ya na-edebe magazin ndị ahụ n’akụkụ ihe ndina ya ma na-agụ ha n’abalị.

“N’ikpeazụ, nwanne nwanyị Candy nwụrụ. Mụ na papa m na mama m gwara Candy okwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. O kpebiri ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ya. N’ụbọchị dị iche, anyị jụrụ Dick ma ọ ga-achọ isoro Candy mụọ ihe ma mee ya ọmụmụ ihe ezinụlọ. O chere na nke ahụ bụ ihe dị mma. Ya mere ugbu a, n’isonyere papa m, m na-eduziri ma Dick ma Candy ọmụmụ ihe. Ha na-enwe ọganihu dị mma ma na-ekwupụta ekele ha maka ọmụmụ Bible ahụ.

“Anọwo m na-ekpe ekpere maka ọmụmụ Bible, Jehova zakwara ekpere m!”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya