Mmezu nke Amụma Bible
E GOSIPỤTARA otu klọọkụ pụrụ iche na otu aka ngụkọ ígwè electronic na-eduzi n’Imperial War Museum dị na London, England. Ka klọọkụ ahụ na-aga gburugburu, aka ngụkọ ahụ na-akụ n’ime sekọnd 3.31 ọ bụla. Oge ọ bụla ọ kụrụ, a na-atụkwasị nọmba ọzọ ná ngụkọta ahụ. Tịmkọm nke ọ bụla, nọmba nke ọ bụla, na-anọchite anya otu nwoke, nwanyị, ma ọ bụ nwatakịrị nwụworo n’ihi agha n’ime narị afọ a.
Aka ngụkọ ahụ malitere ngụkọ ya na June 1989, a na-atụkwa anya na ọ ga-akụzu ọnụ ọgụgụ ahụ n’etiti abalị chi ọbụbọ nke afọ 2000. Ka ọ na-erule oge ahụ ọnụ ọgụgụ aka ngụkọ ahụ ga-egosi ga-abụ otu narị nde—bụ́ ọnụ ọgụgụ a na-eme atụmatụ ịbụ ndị nwụrụ n’ihi ihe metụtara agha na narị afọ nke 20 dum.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, Jisọs Kraịst buru amụma oge nke a ga-eji ‘mba ibili megide mba na alaeze ibili megide alaeze’ kaa akara. N’ikwekọ na nke ahụ, Ndịàmà Jehova anọwo na-ekwusa eri ogologo oge na agha ndị na-ebibi ihe nke narị afọ a, tinyere ọtụtụ ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ihe omume ndị ọzọ, ga-abụ ihe àmà jikọrọ ọnụ na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ”—oge na-eso ochichi e chiri Kraịst Eze n’eluigwe n’afọ 1914.—Luk 21:10, 11; 2 Timoti 3:1.
N’iji Bible eme ihe dị ka ikike ya, Ụlọ Nche na-akpọsa ozi ọma ahụ bụ na n’isi nso Alaeze Chineke ga-emebi ndị mmegbu ma gbanwee ala ịghọ paradaịs. Gịnịkwa banyere ọdịnihu nke ibu agha? Bible na-ekwu, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala [agha] nile n’ọkụ.”—Abụ Ọma 46:8, 9.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
Klọọkụ: Site n’Ikike nke Imperial War Museum