Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/1 p. 32
  • Mmezu nke Amụma Bible

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmezu nke Amụma Bible
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/1 p. 32

Mmezu nke Amụma Bible

E GOSIPỤTARA otu klọọkụ pụrụ iche na otu aka ngụkọ ígwè electronic na-eduzi n’Imperial War Museum dị na London, England. Ka klọọkụ ahụ na-aga gburugburu, aka ngụkọ ahụ na-akụ n’ime sekọnd 3.31 ọ bụla. Oge ọ bụla ọ kụrụ, a na-atụkwasị nọmba ọzọ ná ngụkọta ahụ. Tịmkọm nke ọ bụla, nọmba nke ọ bụla, na-anọchite anya otu nwoke, nwanyị, ma ọ bụ nwatakịrị nwụworo n’ihi agha n’ime narị afọ a.

Aka ngụkọ ahụ malitere ngụkọ ya na June 1989, a na-atụkwa anya na ọ ga-akụzu ọnụ ọgụgụ ahụ n’etiti abalị chi ọbụbọ nke afọ 2000. Ka ọ na-erule oge ahụ ọnụ ọgụgụ aka ngụkọ ahụ ga-egosi ga-abụ otu narị nde—bụ́ ọnụ ọgụgụ a na-eme atụmatụ ịbụ ndị nwụrụ n’ihi ihe metụtara agha na narị afọ nke 20 dum.

Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga, Jisọs Kraịst buru amụma oge nke a ga-eji ‘mba ibili megide mba na alaeze ibili megide alaeze’ kaa akara. N’ikwekọ na nke ahụ, Ndịàmà Jehova anọwo na-ekwusa eri ogologo oge na agha ndị na-ebibi ihe nke narị afọ a, tinyere ọtụtụ ala ọma jijiji, ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ihe omume ndị ọzọ, ga-abụ ihe àmà jikọrọ ọnụ na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ”—oge na-eso ochichi e chiri Kraịst Eze n’eluigwe n’afọ 1914.—Luk 21:10, 11; 2 Timoti 3:1.

N’iji Bible eme ihe dị ka ikike ya, Ụlọ Nche na-akpọsa ozi ọma ahụ bụ na n’isi nso Alaeze Chineke ga-emebi ndị mmegbu ma gbanwee ala ịghọ paradaịs. Gịnịkwa banyere ọdịnihu nke ibu agha? Bible na-ekwu, sị: “Jeenụ, hụ ọrụ nile nke Jehova, Onye doworo ihe ijuanya dị iche iche n’ụwa, na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa; Ọ na-agbaji ụta, gbupịakwa ube; Ọ na-esure ụgbọala [agha] nile n’ọkụ.”—Abụ Ọma 46:8, 9.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Klọọkụ: Site n’Ikike nke Imperial War Museum

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya