Akụkọ Mgbe Ochie Banyere Iju Mmiri Na-akwado Ihe Ndekọ Bible
IJU Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị Noa bụ ihe mere eme n’ezie. A na-ahụ ụdị dị iche iche nke akụkọ ahụ n’akụkọ ihe mere eme a na-edeghị ede nke ọtụtụ ọdịnala dị iche iche gburugburu ụwa. Ná mba Africa bụ́ Chad, agbụrụ Moussaye si otú a akọwa Iju Mmiri ahụ:
‘O ruru otu oge, n’otu ebe dị anya, e nwere otu ezinụlọ bi n’ebe ahụ. Otu ụbọchị, nne nke ezinụlọ a chọrọ isi ezigbo nri maka ndị ọ hụrụ n’anya. Ya mere o buuru íkwè na ọdụ ya iji sụrie ọka ka ọ ghọọ ntụ ọka. N’oge ahụ igwe dị ala nso karịa ka ọ dị ugbu a. N’ezie, ọ bụrụ na ị matịa aka gị, ị pụrụ imetụ ya aka. O ji ike ya nile sụọ ọka ahụ, n’egbughị oge ọka millet ahụ ghọrọ ntụ ọka. Ma ka ọ na-asụri ya, nwanyị ahụ n’elezighị anya buliri ọdụ ya elu nke ukwuu, o wee sụpuo oghere n’igwe! Ozugbo ahụ, mmiri dị ukwuu malitere ịwụdata n’ụwa. Nke a abụghị mmiri ozuzo nkịtị. O zogidere ruo ehihie asaa na abalị asaa ruo mgbe mmiri kpuchiri ụwa nile. Ka mmiri ahụ na-ezo igwe malitere ịrịgokwu n’elu ruo mgbe ọ kwụsịrị n’ebe ọ dị ugbu a—n’ebe aka na-apụghị iru ya. Lee ọdachi ọ bụụrụ ụmụ mmadụ! Kemgbe ahụ, ihe ùgwù nke imetụ igwe aka efunahụwo anyị.’
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, a pụrụ ịchọta ihe ndekọ oge ochie ndị na-akọ banyere iju mmiri zuru ụwa ọnụ gburugburu ụwa. Ndị amaala kọntinent ndị dị n’America tinyere ndị Aborigine nke Australia nwechara akụkọ banyere ya. Ụmụ irighiri ihe ụfọdụ pụrụ ịdịtụ iche, ma ihe ka ukwuu n’akụkọ ndị ahụ nwere echiche bụ na mmiri kpuchiri ụwa na ọ bụkwa nanị mmadụ ole na ole lanarịrị n’ime ụgbọ mmiri mmadụ mere. Mgbasa nke akụkọ a na-enyekwu nkwado n’eziokwu ahụ bụ na Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ mere, dị ka a kọrọ n’ime Bible.—Jenesis 7:11-20.