Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo mmasị ịgụ mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche? Leenụ ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:
◻ Okwu Jisọs bụ́, “Ndị nile ọ bụla unu na-agbaghara mmehie ha, a gbagharawo ha nye ha,” ọ̀ pụtara na ndị Kraịst pụrụ ịgbaghara mmehie? (Jọn 20:23)
Ọ dịghị ihe ndabere ọ bụla nke Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ikwubi na ndị Kraịst n’ozuzu ha, ma ọ bụ ọbụna ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ, nwere ikike Chineke ịgbaghara mmehie. Ihe gbara okwu Jisọs gburugburu yiri ka ọ na-egosi na Chineke esitewo n’ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ nye ndị ozi ahụ ike pụrụ iche ịgbaghara mmehie ma ọ bụ ijide mmehie. (Lee Ọrụ 5:1-11; 2 Ndị Kọrint 12:12.)—4/15, peji nke 28.
◻ Gịnị dị ịrịba ama ná nsụgharị J. J. Stewart Perowne nke akwụkwọ Abụ Ọma, nke e bipụtara mbụ na 1864?
Ná nsụgharị ya, Perowne gbalịrị ịrapagidesi ike “n’ụzọ chiri anya n’ụdị nke Hibru ahụ, ma n’akpaalaokwu ya ma ná nhazi nke ahịrịokwu ya.” N’ime otú ahụ o nwere mmasị karịsịa ná mweghachi nke aha Chineke n’ụdị bụ́ “Jehova.”—4/15, peji nke 31.
◻ Nduzi dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya banyere mmekọrịta ha na gọọmenti dị iche iche nke ụwa?
Jisọs kwuru, sị: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) O kwukwara, sị: “Onye ọ bụla nke ga-ejide gị ije otu mile, so ya jee mile abụọ.” (Matiu 5:41) Jisọs na-egosipụta n’ebe a ụkpụrụ nke iji nrubeisi mee ihe a chọrọ nke iwu kwadoro, ma ọ bụ ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma ọ bụ n’ihe ndị gọọmenti chọrọ ndị kwekọrọ n’iwu Chineke. (Luk 6:27-31; Jọn 17:14, 15)—5/1, peji nke 12.
◻ Gịnị ka ‘ijegharị n’eziokwu’ pụtara? (Abụ Ọma 86:11)
Nke a na-agụnye irube isi n’ihe nile Chineke chọrọ na ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na n’obi eziokwu. (Abụ Ọma 25:4, 5; Jọn 4:23, 24)—5/15, peji nke 18.
◻ Gịnị ka a rụzuru site ná nzipụ Jehova zipụrụ Jona gaa Nineve?
Dị ka ihe siziri mee, ọrụ ime nkwusa nke Jona gosiri ọdịiche dị n’etiti ndị Nineve nwere nchegharị na ndị Israel na-ekwesi olu ike, bụ́ ndị na-enweghị okwukwe na ịdị umeala n’obi ma ọlị. (Tụlee Deuterọnọmi 9:6, 13; Jona 3:4-10.)—5/15, peji nke 28.
◻ Ònye bụ Agwọ ahụ, ònye bụkwa “nwanyị ahụ” e zoro aka na ha na Jenesis 3:15?
Agwọ ahụ abụghị agwọ nkịtị ahụ kama onye ahụ ji ya mee ihe, Setan bụ́ Ekwensu. (Mkpughe 12:9) “Nwanyị ahụ” abụghị Iv kama nzukọ eluigwe nke Jehova, nne nke ndị ohu ya e ji mmuọ nsọ tee mmanụ n’elu ala. (Ndị Galetia 4:26)—6/1, peji nke 9.
◻ Olee otú mmadụ pụrụ isi si na Babilọn Ukwu ahụ pụta wee chọta ebe nchebe? (Mkpughe 18:4)
Ọ ghaghị ikewapụ onwe ya kpam kpam pụọ ná nzukọ okpukpe ụgha dị iche iche nakwa site n’omenala na mmụọ ndị ha na-akwalite, mgbe ahụkwa o kwesịrị ịchọta nchebe n’ime nzukọ ọchịchị Jehova. (Ndị Efesọs 5:7-11)—6/1, peji nke 18.
◻ N’ihi gịnị ka e ji akpọkarị ugo aha n’Akwụkwọ Nsọ?
Ndị dere Bible zoro aka na njimara nke ugo iji mee ihe atụ nke ihe ndị dị ka amamihe, nchebe Chineke, na ịdị gara gara.—6/15, peji nke 8.
◻ Ndị ohu Chineke taa ndị nwere olileanya elu ala hà nwere ọ̀tụ̀tụ̀ mmụọ Chineke haruru ka nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ?
N’ụzọ bụ isi, azịza ya bụ ee. Mmụọ Chineke dị n’ụzọ hà nhata nye òtù abụọ ahụ, a na-enyekwa ha abụọ ihe ọmụma na nghọta n’ọ̀tụ̀tụ̀ hà nhata.—6/15, peji nke 31.
◻ N’ihi gịnị ka o ji baara anyị uru taa inyocha ozi dị nsọ nke ndị nchụàjà Israel jere n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem?
Site n’ime otú ahụ anyị pụrụ ịbịa ghọta n’ụzọ zuru ezu karị ndokwa obi ebere ahụ bụ nke ụmụ mmadụ na-eme mmehie taa pụrụ isi na ya ghọọ ndị e mere ka ha na Chineke dịghachi ná mma. (Ndị Hibru 10:1-7)—7/1, peji nke 8.
◻ Olee otú ụlọ nsọ nke abụọ ahụ e wuru na Jerusalem si nwee ebube dị ukwuu karịa nke Solomọn wuru?
Ụlọ nsọ nke abụọ ahụ ji 164 afọ nọkarịa ụlọ nsọ Solomọn. Ọtụtụ ndị na-efe ofufe sitere n’ọtụtụ ala karị nubara n’ogige ya nile. Nke ka mkpa, ụlọ nsọ nke abụọ a nwere oké ịpụ iche nke ịbụ nke Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, nọrọ n’ime ogige ya zie ihe.—7/1, peji nke 12, 13.
◻ Olee mgbe Chineke wepụtara ụlọ nsọ ime mmụọ ya?
Nke a bụ na 29 O.A. mgbe Chineke gosiri nnabata ya nke ekpere baptism ahụ nke Jisọs. (Matiu 3:16, 17) Nnakwere Chineke nakweere ochiche e chere ahụ Jisọs dị ka àjà pụtara na, n’echiche ime mmụọ, ebe ịchụàjà karịrị nke dị n’ụlọ nsọ Jerusalem amalitewo ịrụ ọrụ.—7/1, peji nke 14, 15.
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-agbaghara? Ịgbaghara onye mejọrọnụ nke rịọworo mgbaghara dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ejigide ịdị n’otu ndị Kraịst anyị. Ibu iro na ibu iwe n’obi ga-anapụ anyị udo nke uche. Ọ bụrụ na anyị adịghị agbaghara, anyị nọ n’ihe ize ndụ nke na otu ụbọchị Jehova agakwaghị agbaghara anyị mmehie anyị. (Matiu 6:14, 15)—7/15, peji nke 18.
◻ Olee otú ndị Israel pụrụ isi ghọọ ndị dị nsọ?
Ịdị nsọ ga-ekwe omume nanị site na ha na Jehova, bụ́ Chineke dị nsọ, inwe mmekọrịta chiri anya, na site n’ofufe dị ọcha ha na-efe ya. Ọ dị ha mkpa inwe ezi ihe ọmụma nke “Onye Nsọ” ahụ iji fee ya ofufe n’ịdị nsọ, n’ịdị ọcha anụ ahụ na nke ime mmụọ. (Ilu 2:1-6; 9:10)—8/1, peji nke 11.