Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 8/1 p. 32
  • “Ọ̀ Kwa Adịghị M Arọ Nrọ?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ̀ Kwa Adịghị M Arọ Nrọ?”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 8/1 p. 32

“Ọ̀ Kwa Adịghị M Arọ Nrọ?”

Akụkọ na-esonụ sitere Malawi banyere otu n’ime Mgbakọ Distrikti “Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto” nke Ndịàmà Jehova mere n’ebe ahụ n’oge okpomọkụ nke 1995 bụ́ nke mere ihe akụkọ.

“N’OKPORO ụzọ bụ isi, ihe dị ka ọkara ụzọ gaa n’ụsọ mmiri n’akụkụ ọdịda anyanwụ nke Ọdọ Mmiri Malawi, e tinyewo ihe odide na nke mbụ ya na 29 afọ. Ọ na-agụ, sị, ‘Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova.’

“A dọbara otu nnukwute gwongworo n’akụkụ ihe odide ahụ, ihe karịrị 200 mmadụ si obodo Mzuzu sitekwara n’ime ihe ọ dọkpụ pụta. Ha ewetawo ọtụtụ ngwugwu uwe, blanket, ite, bọket, nri, nkụ, na Bible iji sonyere ihe dị ka 3,000 ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị sitere ebe ndị ọzọ.

“Ka anyị na-ekele ụmụnna si na gwongworo ahụ na-apụta, George Chikako, dị 63 afọ, bịarutere, na-akwa ịnyịnya ígwè ya na-aga n’elu uzuzu, ebe o siteworo Nkhotakota gbaa ya ruo ụbọchị abụọ. Ruo ọtụtụ afọ, Nwanna Chikako gara mkpọrọ ugboro anọ n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ imebi ụkpụrụ Bible. Nwa nwanne nna ya nwụrụ site n’ihe e tiri ya mgbe a tụrụ ya nga. ‘Ọ̀ kwa adịghị m arọ nrọ?’ ka Nwanna Chikako na-ajụ. ‘A na-enwe mgbakọ a n’etiti ehihie, ndị a na-abụkwa abụ Alaeze n’olu dara ụda! N’oge a nile, ọ dịwo mkpa na anyị ga-ezukọ n’ọchịchịrị nke abalị, jiri olu dị ala bụọ abụ Alaeze, ma na-ahịọkọta aka anyị n’ịkụ aka. Ugbu a anyị na-ezukọ n’ihu ọha, ndị mmadụ na-enwekwa ihe ijuanya ịhụ na anyị dị nnọọ ọtụtụ mgbe ha chere na anyị dị nnọọ ole na ole!’

“E ji ahịhịa gbaa ala mgbakọ ahụ gburugburu ma jiri amị kpuchie elu ya iji mee ndo. E wuru ntakịrị ụlọ akịrịka na ụlọ ebe obibi ghere oghe iji nye ndị bịara mgbakọ ụlọ. Ikuku abalị jupụtara n’ụda olu ụtọ mara mma nke egwu mkpagbu na-adịkwaghị egbochi.

“Lee nnọọ ka o si daba n’isiokwu mgbakọ ahụ bụ́ ‘Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto’!”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Ike mbipụtaghachi © 1995 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya