Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu!
N’IKPEAZỤ oge eruola mgbe agadi nwoke ahụ ga-ahụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa! Site ná mkpughe sitere n’aka Chineke Simeọn maara na “ọ gaghị ahụ ọnwụ, ruo mgbe ọ ga-ahụ Kraịst nke Onyenwe anyị.” (Luk 2:26) Ma lee ihe na-akpali mmasị ọ bụ mgbe Simeọn banyere n’ụlọ nsọ ahụ, Meri na Josef ekunyekwa ya nwa ọhụrụ ahụ bụ́ Jisọs! O nyere Chineke otuto, na-asị: “Onyenwe m, ugbu a ka Ị na-ahapụ ohu Gị ka ọ laa n’udo . . . n’ihi na anya m ahụwo nzọpụta Gị . . . ìhè a ga-ekpughere mba nile ọzọ, na ebube ndị Gị, bụ́ Israel.”—Luk 2:27-32; tụlee Aịsaịa 42:1-6.
Jisọs, malite na baptism ya n’afọ nke 30 ruo ọnwụ ya, gosiri onwe ya ịbụ “ìhè” nye ụwa. N’ụzọ ndị dị aṅaa? O nwupụtara ìhè ime mmụọ site n’ikwusa banyere Alaeze Chineke na nzube Ya nile. O kpughekwara ozizi ụgha ndị nke okpukpe ma mee ka a mata n’ụzọ doro anya ọrụ nile nke ọchịchịrị. (Matiu 15:3-9; Ndị Galetia 5:19-21) Ya mere, Jisọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi, sị: “Mụ onwe m bụ Ìhè nke ụwa.”—Jọn 8:12.
Jisọs nwụrụ n’afọ 33 O.A. Ìhè ahụ ọ̀ nyụrụ mgbe ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ọ ka nọ n’ụwa, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ.” (Matiu 5:16) N’ihi ya, mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya nọgidere na-eme ka ìhè ahụ na-enwu.
N’iṅomi Jisọs, ndị Kraịst taa na-enwupụ ìhè Jehova site n’ịrụ ọrụ nkwusa ahụ. Ha ‘na-ejegharị dị ka ụmụ nke ìhè,’ na-egosipụta onwe ha ịbụ ezi ihe nlereanya n’ibi obi ndị Kraịst.—Ndị Efesọs 5:8.