Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
‘Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè n’Ime Ụwa’
NDỊÀMÀ JEHOVA dị nnọọ iche n’ụzọ pụtara ìhè, ọtụtụ mgbekwa ha na-enweta mkpọsa na-adịghị mma n’ihi na ha adịghị anakwere mmịnye ọbara. Otú ọ dị, nguzo a gbadosiri ụkwụ ike na Bible. Ọ na-egosi na Chineke kagburu iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ebe ọ bụ na ọbara dị oké ọnụ ahịa n’anya ya. (Jenesis 9:3, 4; Levitikọs 17:14) N’ihi inyocha Akwụkwọ Nsọ n’okwu a, Ndịàmà Jehova kwubiri na ntụzi Bible bụ́ ‘izere ọbara’ ga-agụnye n’ụzọ doro anya usoro ime ihe nke oge a nke ịmịnye ọbara.—Ọrụ 15:19, 20, 28, 29.
N’afọ ndị na-adịbeghị anya ndị ọrụ ahụ ike na ọgwụ, tinyere ụlọikpe dị iche iche ná mba ụfọdụ, abịawo kwadoo Ndịàmà Jehova n’okwu a. Dị ka ihe atụ, na Denmark otu nne na-akatabeghị ahụ bụ́ onye maara echiche Bible banyere ọbara nwụrụ n’ihi ihe ọghọm ụgbọ ala. N’ihi ọjụjụ ọ jụrụ ịnara mmịnye ọbara, ndị dọkịta ya kpaliri mkpọsa dị njọ were otu ọnwa site n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi megide Ndịàmà Jehova.
Ndị mụrụ nwa agbọghọ ahụ rịọrọ ka e mee nchọpụta, n’April 1994 kwa, Òtù Ọrụ Maka Mkpesa Ndị Ọrịa nke Denmark mara ọkwa otu mkpebi. O kwuru na onye ọrịa ahụ nwụrụ, ọ bụghị n’ihi na ọ jụrụ ọbara, kama n’ihi mmehie ihe nke nkà ọgwụ. Mkpebi ahụ gbadoro ụkwụ ná nchọpụta nke Òtù Nkà Mmụta Ọgwụ na Iwu na nke ndị isi ọrụ ahụ ike mere. N’otu akwụkwọ e degaara ụlọ ọrụ nlekọta ahụ ike nile na Denmark, Òtù Ahụ Ike Mba ahụ kwuru na ndị dọkịta nwere ibu ọrụ nke inye Ndịàmà Jehova ụdị ọgwụgwọ ọzọ e nwere nke kasị mma, na-eburu n’uche ọjụjụ ha na-ajụ ịnara ọbara.
Ọnọdụ ọzọ metụtara Dan, bụ́ Onyeàmà dị afọ 15, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ọrịa leukemia. Na nke a ndị dọkịta kwanyeere mkpebi Dan ji obi ike mee ịjụ mmịnye ọbara ùgwù. Nke a rụpụtara mkpọsa ozi gbasara agbasa nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi nọrọ na ya taa ndị dọkịta ụta maka ọnwụ Dan. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ekwetaghị ná mkpọsa ahụ na-adịghị mma.
Dị ka ihe atụ, onye hedmasta n’ụlọ akwụkwọ Dan jere akwụkwọ bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze maka olili ozu ya. O gosipụtara ihe ijuanya ná mgbasa akụkọ ahụ na-adịghị mma banyere ọnwụ Dan. Mgbe ọ jụsịrị Onyeàmà ya na ya na-arụkọ ọrụ ọtụtụ ajụjụ banyere Ndịàmà Jehova, ọ nakweere otu ihe nkiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Ihe nkiri vidio ahụ masịrị ya nke ukwuu nke na o mere ndokwa ka ndị nkụzi nile nọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ kirie ya. Ka e mesịrị, e gosiri ụmụ akwụkwọ nile ihe nkiri vidio ahụ, otu klas gasịa klas ọzọ esote.
Minista okwu ahụ ike dị n’aka na Denmark ekwetaghịkwa ná mkpọsa ahụ na-adịghị mma nke ndị dọkịta Dan nwetara. O kwuru na ndị dọkịta ahụ mere ihe kwesịrị ekwesị n’ịkwanyere mkpebi tozuru okè nke Dan mere na okwukwe ya siri ike ùgwù.
E nwere ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị na-erubere iwu nile nke Chineke isi. N’ihi nrubeisi ha, ha na-eguzopụ iche, ‘na-enwu dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.’—Ndị Filipaị 2:12, 15.