Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—New Zealand
ÀGWÀETITI hà pụrụ ito Jehova? Ee, dị ka Aịsaịa 42:10 na-ekwu: “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ, kwusaanụ otuto Ya site ná nsọtụ ụwa . . . , àgwàetiti nile, na ndị bi ha.” Àgwàetiti ndị mejupụtara New Zealand na-eto Jehova n’ezie. Ọ bụ nke a ma ama n’ụwa maka ọdọ mmiri dị iche iche, osimiri ndị batụrụ n’etiti ugwu, ugwu ndị dị oké elu, oké mkpụkọ ice, ụsọ osimiri, ọhịa mmiri ozuzo ndị jupụtara n’ahịhịa fern, na ala dị larịị jupụtara n’ahịhịa ebe a na-akpa anụ, New Zealand na-ekwuwa okwu banyere ịdị ukwuu na ịdị ebube nke Onye Okike eluigwe na ụwa.
Kemgbe nnọọ mmalite narị afọ a, ọtụtụ ndị karị bi na New Zealand etinyewo olu ha n’ito Jehova site n’ichigharịkwuru ya n’ofufe dị ọcha na iso ndị ọzọ kerịta ozi ọma nke Alaeze Chineke. N’isi nso a, otu Onyeàmà nụworo ọmarịcha ahụmahụ banyere ịgbara ndị ikwu àmà kpebiri itinye mgbalị n’ezinụlọ ya. O nyere ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ ya akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala dị ka onyinye. Gịnị ka ọ rụpụtaworo ka ọ dị ugbu a? Ọ na-akọ na otu nwanne ya nwanyị na otu nwanne ya nwoke na-amụ Bible ugbu a, e mewo otu nwa nwanne ya baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, ndị ọzọ na-egekwa ntị nke ọma karị ugbu a n’eziokwu nke Okwu Chineke. Ọ ka nwere ubi sara mbara ịrụ ọrụ; e wezụga nne na nna ya, o nwere ụmụnne ndị nwoke isii na ndị nwanyị itoolu!
A na-enyekwa Jehova otuto mgbe Ndịàmà jikọtara aka ọnụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Dị ka ihe atụ, Roy Perkins bụ́ onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ dere n’Opotiki News nke May 17, 1994, sị: “Ebe m bụ onye na-ekweghị ekwe, ọrụ na mgbalị nke ndị ọrụ nile raara onwe ha nye bụ́ ndị tinyere oge na mgbalị dị ukwuu n’ọrụ ahụ n’ihi ịhụnanya maka Chineke ha masịrị m nke ukwuu.
“N’ime hour nile a e ji rụọ ọrụ ná ngwụsị izu, ọ dịghị mgbe m hụrụ ma ọ bụ nụ banyere otu esemokwu ndị òtù ọrụ ọ bụla . . . Ụmụ nwanyị nọ n’elu ihe e ji arị elu soro ụmụ nwoke na-arụkọ ọrụ, na-akpụchasị ahụ ájá, na-ebuli ihe, na-ebugharị ihe, mmadụ nile n’ọnọdụ ntụsara ahụ na obi ụtọ.
“Ọ dịghịkwa otu minit furu efu ka onye ọ bụla hapụrụ ọrụ ịkpụrụ siga. Nye ndị ahụ nile na-arụ ọrụ n’akụkụ ọ bụla, ikuku dị ọcha dịkwa mma ruo ókè uzuzu ágbá na ntụ brick nyere ohere ya.”
Òtù ndị okenye Ọgbakọ Opotiki dere, sị: “Ihe owuwu ahụ dum emetụtawo obodo a nke ukwuu. O yiri nnọọ ka onye ọ bụla ọ̀ na-ekwu banyere ya. A malitewo ọtụtụ ọmụmụ Bible. Otu kpọmkwem nke na-abụrụ anyị ihe na-akpali nnọọ akpali bụ otu di na nwunye ji okpukpe kpọrọ ihe nke ukwuu, bụ́ ndị ruo ọtụtụ afọ gwaworo anyị ka anyị ghara ịkpọtụrụ ha. Ha bịara n’ala ihe owuwu ahụ kwa ụbọchị, bịakwa nzukọ. Onye nke bụ di mesịrị kwuo, ‘Apụrụ m ịhụ na unu bụ ndị Chineke. N’ime obi m, ọ nọwo na-agụsi m ike ná ndụ m nile iso ndị dị ka ndị a na-akpakọrịta.’”
N’afọ gara aga, otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ Otago Daily Times kwuru ihe na-esonụ banyere otu Ụlọ Nzukọ Alaeze a rụrụ ọsọ ọsọ na Dunedin: “Ọ bụ ihe omume dị ịrịba ama, ihe nlereanya dị ịrịba ama nke nkwali na inyere onwe onye aka.” Otu akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ndị bi n’obodo ukwu a ji oké mmasị kirie ka nnukwute ụlọ na-etolite n’anya ha, ọtụtụ aghaghịkwa ịdị na-atụgharị n’uche banyere mgbanwe na ezigbo ọrụ ndị ọzọ a pụrụ ịrụzu ma ọ bụrụ na e nwere otu ụdị nchịkọta a bara ụba nke ndị ọrụ afọ ofufo na mmụọ dị ukwuu nke ikwenye ekwenye. Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ihe ama e ji anya isi nke ezi mgbalị na-arụpụta ihe.”
Banyere ọtụtụ narị ndị bịara n’ala ihe owuwu ahụ, otu nwoke kwuru na Ndịàmà na-ewu “ụlọ chọọchị” ebe òtù okpukpe ya na-ere ha n’ihi ọnụ ọgụgụ na-adalata adalata nke ndị òtù. “A sị na unu cherekwuuru ruo ọnwa iri na abụọ ọzọ, unu gaara azụrụ otu n’ime ndị nke anyị,” ka o kwuru. “Anyị aghaghị ire otu n’ihi na anyị apụghị ịnọgide na-akwụ ụgwọ ya. Ma, otú ọ dị, unu enweghị ndị ụkọchukwu a na-akwụ ụgwọ. . . . Ụlọ unu adịghịkwa achọ oké ego ná nlekọta, ha abụghị ụlọ ndị dị elu nwere steeple ndị a na-apụghị ilekọta elekọta.”
N’ụzọ doro anya, àgwàetiti pụrụ n’ezie ito Chineke. Ka otuto Jehova nọgide na-adapụta ụda n’ala Pacific nke a mara mma—na gburugburu ụwa!
[Igbe dị na peeji nke 9]
IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ:
Afọ Ije Ozi 1994
ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 12,867
NKEZI: 1 Onyeàmà maka 271
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 24,436
NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ́ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 1,386
NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 7,519
ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 568
ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 158
ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: MANUREWA
[Foto dị na peeji nke 9]
Ndị ọsụ ụzọ na-apụ ije ozi ubi n’ihe dị ka na 1930
[Foto dị na peeji nke 9]
Alaka ụlọ ọrụ dị na Manurewa
[Foto dị na peeji nke 9]
Ikwusa ozi Alaeze na Devonport, Auckland