‘Oo, A Sị Nnọọ na Mmadụ Nile Dị Ka Ha!’
Ndị a bụ okwu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ Luxembourg bụ́ Letzebuerger Journal. Ole ndị ka ọ na-ekwu maka ha?
O jewo Poland ịga ememe ncheta nke afọ 50 nke nnwere onwe Auschwitz wee chọpụta na a kpọghị aha otu ìgwè nke tara ahụhụ nke ukwuu n’ebe ahụ ma ọlị. N’akụkụ ya pụrụ iche nke February 2, 1995, ọ kọwara ìgwè a dị ka Ndịàmà Jehova ma dee, sị: “Ma ịtụ mkpọrọ kasị ike ma ogige ịta ahụhụ ma ọ bụ iyi egwu ịnwụ ọnwụ nhụsianya n’ogige ebe ndị a na-akwụwa mmadụ agụụ ma ọ bụ n’okpuru anyụike adịghị nke pụrụ ime ka ha jụ okwukwe ha.” Ọ gakwara n’ihu sị: “Ọbụna na o juru ndị nche SS obi tara mmiri anya otú Ndịàmà Jehova si jiri obi ike nwụọ.”
Ndịàmà Jehova achọghị ịnwụ. Ma, dị ka ndị Kraịst na narị afọ mbụ, ọtụtụ puku n’ime ha họọrọ ọnwụ kama imebi ụkpụrụ ndị Kraịst. Okwukwe dị otú a kara ha akara dị ka ndị dị nnọọ iche n’oge ọjọọ nke Ọchịchị Nazi.
Onye a na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ kwubiri: “Oo, a sị nnọọ na mmadụ nile dị ka Ndịàmà Jehova!” Ọ bụrụ na ha dị otú ahụ, a garaghị alụ Agha Ụwa nke Abụọ.