Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 8/15 p. 32
  • Ahụ Efe Maka Ndị Aka Ha Dị Ọcha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụ Efe Maka Ndị Aka Ha Dị Ọcha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 8/15 p. 32

Ahụ Efe Maka Ndị Aka Ha Dị Ọcha

Ọ BỤ otu n’ime mpụ ndị kasị njọ mmadụ metụrụla—ememe okpukpe nke iji ụmụaka achụ àjà. Ụfọdụ ndị adịghị ekwere na ihe arụ dị otú ahụ pụrụ iwereworị ọnọdụ. Ma akara a e ji mara ofufe ndị Finisia abụrụwo nke ọtụtụ ihe ndị e gwupụtara n’ala kwadoro.

Ụmụaka ndị sitere n’ezinụlọ ndị a maara aha ha bụ ndị e surere n’ọkụ nye chi ndị dị ka Tanit na Beal-Hammon. Na Carthage e surere ụmụ ntorobịa n’ọkụ n’àjà nye ihe oyiyi Kronos e ji ọla bronze kpụọ. Diodorus Siculus, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme nke narị afọ mbụ T.O.A., na-asị na e kweghị ka ndị ikwu nke nwa ahụ bee ákwá. Eleghị anya, e kwenyere na anya mmiri nke nhụsianya ga-eme ka uru nke ájá ahụ belata.

Ruo oge ụfọdụ ememe okpukpe yiri nke ahụ weere ọnọdụ ná nso Jerusalem na Tofet oge ochie. Ndị na-efe ofufe n’ebe ahụ ga-agba egwú ma tisie egwú otiti ike ka e wee ghara ịnụ ákwá nwatakịrị ahụ ka a na-atụba ya n’ime afọ Molek bụ́ ite ọkụ ukwuu.—Jeremaịa 7:31.

Jehova na-ewe iwe dị ukwuu megide ndị obi tara mmiri kpọchiri ntị ha n’ihe mgbu nke ndị ọzọ. (Tụlee Ilu 21:13.) Dị ka Chineke na-egosi ọmịiko maka ụmụaka, Jehova aghaghị n’ezie ịgụnye ndị dị otú ahụ aka ha dị ọcha ná “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume.”—Ọrụ 24:15; Ọpụpụ 22:22-24.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya