A Tụleghachi Mmịnye Ọbara
N’ỌGBỌ ọchịchịrị a nke ọrịa AIDS, ihe iyi egwu kasịnụ nye ahụ ike onye ọrịa nọ n’ụlọ ọgwụ pụrụ izo n’ọnụ ụlọ ebe a na-awa ahụ. “E nweghị ụzọ ọ bụla anyị pụrụ isi mee ka ọbara a na-enweta dị ọcha kpam kpam,” ka Dr. Richard Spence na-ekwu, onye ruo ihe karịrị afọ iri bụworo onye ntụzi nke Ụlọ Ọrụ Ịwa Ahụ N’ejighị Ọbara nke dị na Cooper Hospital-University Medical Center na Camden, New Jersey, U.S.A.
Ka a sịkwa ihe mere ụlọ ọrụ ahụ ji na-agwọ ọtụtụ Ndịàmà Jehova, ndị ọjụjụ ha dabeere na Bible nke ha na-ajụ mmịnye ọbara bụ nke a maara nke ọma. (Levitikọs 17:11; Ọrụ 15:28, 29) Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọrịa na-abụghị Ndịàmà na-abịakwa n’ụlọ ọrụ ahụ, na-enwe nchegbu banyere ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị ná mmịnye ọbara, ndị gụnyere ibute ịba ọcha n’anya, ọrịa AIDS, na ọrịa ndị ọzọ. “Mpụta nke ọrịa AIDS egosiwo mkpa nke inyocha ọbara,” ka akwụkwọ Courier-Post Weekly Report on Science and Medicine rịbara ama. “Ma ihe ụfọdụ ka pụrụ ịlafere usoro nnyocha ahụ n’ihi na mmadụ pụrụ inwe nje virus ahụ tupu ọ pụta n’ule ahụ.”
N’ihi ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ, Ụlọ Ọrụ Ịwa Ahụ N’ejighị Ọbara na-eji ihe ndị na-abụghị mmịnye ọbara, gụnyere ntinyeghachi nke ọbara onye ọrịa ahụ—usoro nke Ndịàmà ụfọdụ pụrụ ịnakwere n’ọnọdụ ụfọdụ, eme ihe.a Usoro ọgwụgwọ ọzọ gụnyere iji ọgwụ ndị na-akpali mmepụta nke ọbara n’onye ọrịa ahụ eme ihe. Ọzọkwa, mgbe ụfọdụ a na-eji ihe nnọchiteanya ọbara mmadụ mere eme ihe iji kwalite mbugharị ikuku oxygen n’enweghị mkpa maka ọbara a mịnyere amịnye. “Ndịàmà Jehova na-achọ nlekọta ahụ ike kasị mma,” ka Dr. Spence na-ekwu, “ma ha na-achọ ihe ndị ọzọ na-abụghị mmịnye ọbara.”
Ndịàmà Jehova nwere ekele maka nkwado na enyemaka ha na-enweta site n’aka ndị dọkịta na-akwanyere nkweta okpukpe ha ùgwù. N’ihi ya, ha enwetawo n’ezie “nlekọta ahụ ike kasị mma” ma nọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha n’ihu Jehova Chineke.—2 Timoti 1:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E wepụtara ntụle sara mbara nke usoro a na ihe ndị ọzọ ime mkpebi onwe onye site n’ezi akọ na uche gụnyere n’Ụlọ Nche nke March 1, 1989, peji nke 30-31.