Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 32
  • “Gabiga Ókè nke Isi Izu Okè”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Gabiga Ókè nke Isi Izu Okè”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 32

“Gabiga Ókè nke Isi Izu Okè”

“EBE agha na-amalite n’uche ndị mmadụ, ọ bụ n’uche ndị mmadụ ka anyị ga-ewu ebe siri ike nke udo.” (Nkwekọrịta nke Òtù Agụmakwụkwọ, Sayensị, na Ọdịbendị nke Òtù UN) N’iburu okwu a n’uche, na 1993 ihe karịrị 500 ndị ọkachamara gara nzukọ UN banyere ịkwasa ngwá agha tụlere òkè okpukpe na-ekere n’iwu ụdị ebe siri ike ahụ.

Jonathan Granoff, onye nọchitere anya Njikọ Ndị Ọkà Iwu Maka Nchebe Ụwa, duziri nzukọ ahụ. Ọ sịrị: “Ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọgụ okpukpe na agbụrụ a na-alụ ugbu a gabigara ókè nke omume ndị mepere anya, ikekwe gabiga ókè nke isi izu okè.” E hotara okwu John Kenneth Galbraith n’ụzọ ziri ezi n’oge nzukọ ahụ: “E gbuwo ọtụtụ ndị n’aha okpukpe karịa ka e gbuworo ná ngụkọta nke agha nile na ọdachi nile ndị na-emere onwe ha.”

Dr. Seshagiri Rao kwuru, sị: “Ndị dibịa kwesịrị ịdị na-agwọ ọrịa, ọ bụghị ịgbasa ya. Ọdinala okpukpe dị iche iche ekwesịghị ịgbasa ịkpọasị na ajọ ịlụ ọgụ megide ibe ha. E bu n’uche ka ha bụrụ ikike nke mkpezi. Ma, ihe bụ ezie bụ na ha arụwo ọrụ ma ka na-arụkwa ọrụ dị ka ikike nke nkewasị.”

Ụfọdụ afọ gara aga, Catholic Herald nke London kwuru na a pụrụ ijide udo n’aka “ma ọ bụrụ na chọọchị nile nke taa pụrụ ikwupụta nkatọ ha katọrọ agha.” Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ ahụ gbakwụnyere: “Anyị maara na nke a agaghị eme ma ọlị.” Otu onye nọn Katọlik kwuru n’otu mgbe, sị: “Lee ka ụwa ga-esi dị iche ma ọ bụrụ na anyị nile eteta ụra n’otu ụtụtụ kpebisie ike ịhapụ ibuli ngwá agha ọzọ, . . . dị nnọọ ka Ndịàmà Jehova!”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Tom Haley/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya