Mkpụrụ Ego Ndị Bu aha Chineke
LEERUO nnọọ anya ná mkpụrụ ego ọlaọcha ndị e gosiri n’ebe a. Ọ bụ onyeeze Germany bụ́ Wilhelm nke Ise kpụpụtara ha n’oge ọchịchị ya malite na 1627 ruo 1637. N’oge ahụ, etiti Europe nọ n’Agha Iri Afọ Atọ ahụ, ndọrọ ndọrọ dị n’etiti ndị Katọlik na ndị Protestant. Wilhelm nke Ise kwadoro ndị Protestant. Iji nye ego maka ihe dị ukwuu agha ahụ na-efu, o weere ọlaọcha ya nile ma kpụpụta mkpụrụ ego site na ya.
Dị ka ihe na-akpali mmasị, ihe e sere n’ọtụtụ mkpụrụ ego ahụ gosiri anyanwụ gbara aha Chineke bụ́ Jehova gburugburu, n’ụdị nke Tetragammaton nke Hibru. E nwekwara osisi nkwụ, nke pụtara ume. Echiche dị na ya bụ na osisi ahụ, ọ bụ ezie na ifufe na-eme ka ọ rọgọọ, na-anọgide n’agbajighị n’okpuru nchebe Chineke. Ihe odide Latin e dekwasịrị ná mkpụrụ ego ahụ nwere aha Jehova, na-egosipụtakwa obi ike ná nlekọta nchebe ya.
Kama ịrịọ maka nchebe Chineke, iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ dị otú ahụ bụ n’ezie ihe efu, n’ihi na Jehova adịghị ekere òkè n’esemokwu ihe ike nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ezie, Agha Iri Afọ Atọ ahụ enwetaghị nkwado Chineke. “Dị ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ e leziri anya mee,” ka akwụkwọ bụ́ Funk & Wagnalls New Encyclopedia na-ekwu, “ihe na-adịghị ala karịa ọkara nke ndị Germany nwụrụ n’oge agha ahụ. E bibiri ọtụtụ obodo ukwu, obodo nta, na ala ubi ndị Germany kpam kpam. Ihe dị ka ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ụlọ ọrụ na-emepụta ihe, ngwá ọrụ ubi, na ụlọ ọrụ azụmahịa Germany lara n’iyi.”
Ojiji e ji aha Jehova mee ihe ná mkpụrụ ego ndị a na-echetaghachi iwu ahụ e nyere ndị Israel: “Gị eburula aha Jehova, bụ́ Chineke gị, ime ihe efu.” (Ọpụpụ 20:7) Ka o sina dị, mkpụrụ ego ndị a na-agba àmà na aha nsọ ahụ, bụ́ Jehova, abụwo nke a matararịị nke ọma nye ndị bi na Germany eri oge. Ruo ókè hà aṅaa ka ị maruru Chineke ahụ nwe aha ahụ nke ọma?