Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Ndị Na-eto Eto Na-ekwusa Ozi Ọma ahụ n’Africa
N’OGE na-adịghị anya mgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, otu nwoke onye Africa nọ na-eje Jerusalem. Bible ekwughị aha ya. A maara ya nanị dị ka “onozi nke dị ike nke ukwuu n’okpuru Kandesi, eze nwanyị ndị Etiopia, onye e mere onye isi akụ̀ ya nile.” N’ihi gịnị ka e ji hota ya na Bible? N’ihi na otu mmụọ ozi tụziiri onye Kraịst na-ezisa ozi ọma bụ́ Filip ka ọ gaa kwusaara ya “ozi ọma Jisọs.” Nwoke Etiopia a bụ onye Africa mbụ e mere ndekọ ya nke ghọrọ onye òtù nke ọgbakọ ndị Kraịst.—Ọrụ 8:26-39.
Taa, e nwere ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova n’Africa. Ha na-eji ohere ọ bụla dapụtara eso ndị ọzọ ekerịta ozi ọma Jisọs. Ahụmahụ ndị na-esonụ na-egosi na ọbụna ndị na-eto eto n’Africa na-ekere òkè na nke a.
◻ Sandy na Priya, ụmụ agbọghọ abụọ dị afọ 11 na Nairobi, Kenya, bụ ndị agbata obi. Ọ na-atọ ha ụtọ igwukọrịta egwu na ịgbanwerịta akwụkwọ akụkọ ifo. Nne na nna Priya malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. Ugbu a Priya nwere nhọrọ nke akwụkwọ ndị ọhụrụ ọ ga-etinye ná nchịkọta akwụkwọ ya, gụnyere otu kpọmkwem nke ghọrọ nke na-amasịkarị ya, Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti, nke Watchtower Bible and Tract Society bipụtara. O sooro enyi ya bụ́ Sandy kerịta akwụkwọ Onye-Ozizi Uku ya, ụmụ agbọghọ abụọ ahụ malitekwara ịmụchi ya anya.
Otú ọ dị, nne Sandy, bụ́ Una, na-aga Chọọchị Anglịkan, ọ chọghịkwa ka nwa ya nwanyị gụọ akwụkwọ sitere n’aka Ndịàmà Jehova. N’agbanyeghị mmegide nne ya, ọmụmụ ihe ahụ gara n’ihu. Otu ụbọchị Sandy rịọrọ nne ya ka ọ ṅaa ntị ná nkwurịta okwu ha nanị otu ugbo. A kpọrọ isiakwụkwọ ụmụ agbọghọ ahụ gụrụ n’ụbọchị ahụ “Ndikom Abua Ndi Mere Ememe Ncheta-Ọmumu.” Una gere ntị, ọ masịkwara ya nke ukwuu. Ngwa ngwa o ji ọtụtụ ajụjụ jekwuru nne Priya.
Nne Priya mere ndokwa ka otu Onyeàmà mụọrọ Una Bible. N’oge na-adịghị anya Una n’onwe ya so onye ya na ya na-arụkọ ọrụ bụ́ Dolly na-ekerịta ihe ọ na-amụ. Ka ọ dị na mgbe ahụ, Priya dị afọ 11 nọgidere na-enwe ọganihu ma kpebie igosipụta nraranye ya nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri n’otu mgbakọ distrikti Ndịàmà Jehova. N’otu mgbakọ ahụ, dị ka ihe oké obi ụtọ nye Priya, e mekwara Una na Dolly baptism.
◻ E nwere mba ụfọdụ nke Africa ebe a na-edebaghị ọrụ Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ iwu. N’otu ala dị otú ahụ, e nwere ọnọdụ zuru ebe nile nke ikwe ibe nọrọ n’ebe ihe omume na nkwenkwe okpukpe nke Ndịàmà dị. N’otu ụlọ akwụkwọ n’ala ahụ, e nyere otu nwa okoro dị afọ asaa na nwanne ya nwoke dị afọ isii—ụmụ Ndịàmà—ohere ịpụ n’oge ekpere okpukpe.
Otu ụbọchị onye nkụzi bịara ọhụrụ tiri iwu ka ụmụ okoro ahụ sonye n’ekpere ha na ụmụaka ndị ọzọ. Nke tọrọnụ jụrụ, onye nkụzi ahụ wee pịa ya ihe. Nwanne ya nke nta, bụ́ Shadrack dị afọ isii, siri ọnwụ na ya ga-ahụ onye isi ụlọ akwụkwọ n’ọfịs ya. Onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ na onye nkụzi ọhụrụ ahụ jụrụ ya ihe mere na ọ chọghị isonyere ndị ọzọ. Ha jụrụ ya ma ọ na-atụ egwu ka ndị mụrụ ya ghara ịpịa ya ihe. Ọ zaghachiri n’ezigbote asụsụ Arabic: “Mba, Chineke m na-efe abụghị Chineke nke aghara kama ọ bụ nke ịdị n’usoro. Apụghị m ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova n’ụlọ ma bụrụ onye okpukpe ọzọ n’ụlọ akwụkwọ!” N’ihi ya, e nyere ya ohere ịdị na-apụ.
Mgbe e mesịrị ya baptism, nwoke Etiopia ahụ e hotara n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi “na-aga n’ụzọ ya na-aṅụrị ọṅụ.” (Ọrụ 8:39) N’otu aka ahụ taa, ndị nkwusa Alaeze ahụ na kọntinent ahụ buru ibu bụ́ Africa na-aṅụrị ọṅụ n’ihe ùgwù ha nke ‘izisa ozi ọma Jisọs.’—Ọrụ 8:35.