Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Gịnị Bụ Baptizim?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Mee Baptizim?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee àgwà e kwesịrị igosipụta n’oge ime baptism ndị Kraịst?

Nke ahụ bụ ajụjụ na-akpali mmasị, n’ihi na n’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ndị na-agụ akwụkwọ anyị emeelarị baptism, o metụtara ha, dịkwa ka o metụtara ndị a na-eme baptism. Ka anyị buru ụzọ kwuo okwu banyere ndị na-aga ime baptism, ndị a na-emikpu n’ime mmiri kpam kpam. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà ha?

Na Matiu 28:19, 20, Jisọs gwara ụmụazụ ya ka ha ga mee ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ihe ma na-eme ha baptism. O wepụtaghị baptism dị ka ahụmahụ nke oké mmetụta uche, ihe omume na-esite n’oké mkpali na-adịru nwa oge. Ọ bụ nzọụkwụ siri ike, dị ka anyị na-ahụ site n’ihe nlereanya Jisọs. Luk 3:21 na-asị: “E mesịkwara Jisọs baptism, mgbe Ọ na-ekpekwa ekpere, na e meghere eluigwe.” Ee, Onye Nlereanya anyị weere baptism ịbụ ihe siri ike, ihe a ga-ekpere ekpere. Anyị apụghị iche echiche banyere ya ime akara nke mmeri mgbe o sisịrị n’ime mmiri pụta, na-eme ihe ngosi nke mmeri, na-ama mkpọrọhịhị, ma ọ bụ na-atụli aka ya elu, ọ bụ ezie na ụfọdụ emewo ihe ndị yiri ha n’oge na-adịbeghị anya. Ee e, n’ihu Jọn Baptist, Jisọs chigharịkwuuru Nna ya n’ekpere.

Otú ọ dị, Bible adịghị atụ aro na baptism aghaghị ịbụ ihe ntakpuchi ọnụ ma ọ bụ mgbarụ ihu, na-achọ ka a nọrọ n’otu ọnọdụ ma ọ bụ na-agụ ihe ọgụgụ pụrụ iche, dị ka chọọchị ụfọdụ n’ime Krisendọm na-achọ taa. Cheedị echiche banyere ụbọchị Pentikọst, mgbe e mere ọtụtụ puku ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha baptism nke ndị Kraịst. Ha amụworị Iwu Chineke ma soro ya nwee mmekọrịta. Ya mere nanị ihe dị ha mkpa bụ ịmụta na ịnakwere Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs. Ozugbo ha mere otú ahụ, a pụrụ ime ha baptism.

Ọrụ Ndị Ozi 2:41 na-akọ, sị: “Ndị naara okwu ya nke ọma, e mere ha baptism.” Nsụgharị Bible nke Weymouth mere na-agụ, sị: “Ya mere, e mere ndị ji ọṅụ nabata okwu ya baptism.” Ha nwetara ọṅụ n’ozi na-akpali akpali banyere Mesaịa ahụ, n’ezie ọṅụ ahụ nke sitere n’obi rukwara na baptism ahụ n’onwe ya, baptism e mere n’ihu ọtụtụ narị ndị ji obi ụtọ na-ekiri ihe na-emenụ. Ọbụna ndị mmụọ ozi n’eluigwe nọ na-ekiri ma na-aṅụrị ọṅụ. Chetaghachi okwu Jisọs: “Asị m unu, na otú a ọṅụ dị n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị.”—Luk 15:10.

E nwere ụzọ dị iche iche onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi gosipụta ma ịbụ ihe siri ike ma ọṅụ nke baptism. Na chọọchị ụfọdụ, ndị a na-eme baptism na-eyi uwe ọcha ma ọ bụ ndị ojii. E nweghị nnọọ nkwado Akwụkwọ Nsọ maka ịchọ ihe dị otú ahụ. Ka o sina dị, uwe mmiri ndị na-ahụ ụzọ ma ọ bụ ndị na-adịghị ekpuchicha ahụ dum agaghị ekwesị ekwesị, ma ọ bụ nye ndị ikom ma ọ bụ ndị inyom. Dịkwa ka e kwuru, mgbe e si n’ime mmiri rịgopụta, onye Kraịst ọhụrụ ahụ ekwesịghị ime ngosi ndị pụrụ iche ma ọ bụ na-eme ka a ga-asị na o nwetawo mmeri dị ukwuu. Ndị ọzọ n’òtù ụmụnna ndị Kraịst nwere obi ụtọ na e mere onye ọhụrụ ahụ baptism. O kwesịrị ịghọta na ngosipụta nke a nke okwukwe bụ nanị nzọụkwụ mmalite n’ogologo ụzọ ahụ nke iguzosi ike n’ezi ihe iji nweta nnwapụta nke Chineke.—Matiu 16:24.

Anyị, dị ka ndị na-ekiri ihe na-emenụ na baptism ihu ọha, na-ekere òkè n’ọṅụ nke ememe ahụ, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ na-aga ime baptism bụ onye ikwu ma ọ bụ onye anyị duziiri ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, iji kere òkè n’ụzọ zuru ezu, anyị kwesịrị isoro ndị a ga-eme baptism ṅaa ntị n’okwu ahụ dum, nụ mgbe ha zara n’ihu ọha ajụjụ ndị ahụ a jụrụ ha, ma sonye n’ekpere. Ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ile baptism ahụ n’onwe ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị; anyị ga-enwe echiche Chineke banyere ya. Mgbe e mesịrị baptism, ọṅụ anyị adịghị achọ ime ngagharị mmeri, ùkwù okooko osisi, ma ọ bụ nnọkọ oriri na ọṅụṅụ maka onye ahụ e mere baptism. Ma anyị pụrụ ịgakwuru nwanna anyị nwoke ma ọ bụ nwanyị ọhụrụ iji gosipụta obi ụtọ anyị banyere nzọụkwụ ahụ magburu onwe ya o werewooro na iji gosipụta nnabata na-ekpo ọkụ n’òtù ụmụnna anyị nke ndị Kraịst.

Ná nchịkọtazi, anyị nile, gụnyere ndị kwere ka e mikpuo ha n’ime mmiri, kwesịrị ile baptism anya n’ụzọ iji ihe kpọrọ ihe kwesịrị ekwesị. Ọ bụghị oge nke oké mmetụta uche, ime nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ngosi nke oké mkpali mmụọ. Ma, ọ bụghịkwanụ oge ntakpuchi ọnụ ma ọ bụ ihu mgbarụ. Anyị pụrụ inwe ọṅụ n’ụzọ ziri ezi na ndị ọhụrụ esonyeworo anyị n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Anyị pụkwara iji ọṅụ nabata ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ndị ọhụrụ.

[Foto dị na peeji nke 31]

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya