Jehova Ga-azọpụta Ụwa
ANA-EMECHI otu ọdụ ụgbọ elu dị n’àgwàetiti Maldives ruo ọtụtụ hour kwa ụbọchị. N’ihi gịnị? N’ihi na mmiri ndị toro eto na-eju n’okporo ụzọ ụgbọ elu si agba, na-eme ka ọ dịrị ize ndụ ụgbọ elu ịda na ya. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ egwu na ọ̀tụ̀tụ̀ osimiri n’àgwàetiti Maldives pụrụ ịrị elu ma ọ dịkarịa ala otu mita na narị afọ na-esonụ. Ọ bụ ezie na nke a yiri ọ̀tụ̀tụ̀ naebughị ibu, ịrị elu dị otú ahụ pụrụ ihichapụ mba asaa ndị bụ àgwàetiti pụọ na map. N’ezie, dị ka magazin bụ́ UN Chronicle na-ekwu, ịrị elu mita abụọ pụrụ irikpu kpam kpam ìgwè àgwàetiti ahụ dum, ihe dị ka 1,200 àgwàetiti!
Gịnị na-akpata ọ̀tụ̀tụ̀ osimiri ahụ na-arị elu! Dị ka Òtù Ihe Omume Gburugburu Ebe Obibi nke UN na-ekwu, mmetọ nke mbara ụwa site ‘n’ikuku dị iche iche nke ịrị elu okpomọkụ ụwa’ na-eme ka osimiri ndị dị n’ebe ndị na-ekpo ọkụ karị too eto, mkpụkọba ice n’elu ugwu gbazee, n’ihi ya kwa, ọ̀tụ̀tụ̀ osimiri ịrị elu. Ụlọ ọrụ Panos Institute dị na London na-ekwu na mmetọ “pụrụ ịkpakewo mbibi zuru ụwa ọnụ nke ji nwayọọ nwayọọ na-aga nke na-akpaghasị ókè nile nke ala na osimiri.”
A ka na-arụ ụka ịdị adị nke ikpo ọkụ ụwa dum n’etiti ndị ọkà mmụta sayensị. Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na nsogbu dị iche iche nke mbara ụwa agaghị egbochi nzube Chineke. “Elu ụwa dum mmadụ bi na-eguzosi ike,” ka Bible na-ekwu. “A dịghị ewezụga ya n’ọnọdụ ya.” (1 Ihe Emere 16:30) Jehova na-achịkwa mbara ụwa, anyị pụkwara ịṅụrị ọṅụ na n’isi nso ọ ga-azọpụta ma elu ụwa ma ihe a kpọrọ mmadụ site ná mbibi.—Abụ Ọma 24:1, 2; 135:6; 2 Pita 3:13.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 31]
Ihe osise dabeere na foto NASA