Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 3/15 p. 8-9
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Zambia

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Zambia
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Òtù Ụmụnna Anyị Zuru Ụwa Ọnụ Wusikwuru M Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ọrịa Aids n’Africa—Olileanya Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Narị Afọ Iri Ọhụrụ A?
    Teta!—2000
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 3/15 p. 8-9

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Zambia

MBARA ala dị obosara, nke na-adịghị larịị nke dị elu ugwu nke dị 1,200 mita n’ịdị elu—nke a bụ Zambia, mba nke dị n’etiti ndịda akụkụ etiti Africa. N’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ, Ugwu Muchinga kwụtịrị elu ruo 2,100 mita. Nnukwute Osimiri Zambezi ahụ, nke na-awụda n’ụzọ na-ebu isi na Victoria Falls ahụ a ma ama n’ụwa nile, mejupụtara ihe kanụ n’ókèala ebe ndịda nke mba nke a ala nkịtị gbara gburugburu. E nwere ọdịiche dị ukwuu n’etiti ndị ya, na-enwe ihe karịrị 70 ìgwè ebo dị iche iche. A na-asụ asụsụ asatọ bụ isi n’ebe a, ma e nwere ọtụtụ ndị ọzọ.

Na 1911 asụsụ dị iche malitere ịgba mkpọrọgwụ na ịgbasa na Zambia. Ndị nleta webatara akwụkwọ Studies in the Scriptures, Ndịàmà Jehova sitekwa na mgbe ahụ agbalịsiwo ike ịgbasa “asụsụ dị ọcha” ahụ nke eziokwu Bible na Zambia. (Zefanaịa 3:9, NW) Ihe kasị eweta ihe ịma aka bụ nkwenkwe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Mgbe ndị mmadụ mụtara eziokwu ahụ ma hụ ụzọ nkwenkwe ụgha siworo mee ha ohu, mmetụta ya na-atọhapụ atọhapụ!—Jọn 8:32.

Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi na-akọ, sị: “Mgbe deede m nwụrụ na mberede, nne m, onye òtù na-anụ ọkụ n’obi nke United Church of Zambia, nwere mgbagwoju anya. Mgbe ememe olili ozu ahụ were otu izu gasịrị, alọghachitere m n’ime obodo anyị ịhụ otú ahụ dị ya. Mgbe m rutere, ahụrụ m otu agadi nwoke n’ụlọ ahụ, mgbe ọ lawakwara, m jụrụ nne m ochie onye ọ bụ. Ọ sịrị na ọ bụ dibịa afa. Nne m bu n’uche igo ya ọrụ maka ịbọ ọ́bọ̀ ọnwụ nwanne ya nwoke ka mkpụrụ obi ya wee nwee ike izuru ike. O kwenyere na ka ọ dị na mgbe ahụ ọ ‘nọ nnọọ na-awagharị,’ dị ka o si kwuo ya.

“Nne m ochie kọwakwuru na nleta m bụ ngọzi n’ihi na ezinụlọ anyị na-achọ ego iji kwụọ dibịa afa ahụ ụgwọ. Ọ gwara m ka m tụnye ụtụ, ma m ji akọ kọwaa na dị ka onye Kraịst, enweghị m ike ikere òkè. Eso m ya tụgharịa uche site n’Abụ Ọma 146:4, nke na-egosi na ndị nwụrụ anwụ enweghị echiche ọ bụla—ya mere e nweghị mkpụrụ obi ọ bụla ‘na-awagharị.’ Anyị tụlekwara Ndị Rom 12:19, nke na-eme ka ọ pụta ìhè na ọ́bọ̀ dịịrị Jehova, ọ bụghị anyị. Mgbe nke ahụ gasịrị, m gwara nne m banyere olileanya mbilite n’ọnwụ nke Jisọs kwuru banyere ya, dị ka e dekọrọ na Jọn 5:28, 29. Okwukwe m siri ike ná nkwa nile nke Chineke masịrị ya. N’oge na-adịghị anya ọ malitere iso otu Onyeàmà na-amụ ihe ma nwee ọganihu dị ngwa. O gbubiri ihe nile jikọrọ ya na okpukpe mbụ ya ma gosipụta nraranye ya nye Chineke site na baptism. Ugbu a ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

Nwanna nwanyị ọzọ na-akọ, sị: “Agara m n’olili ozu nke nwunye deede m. Mgbe m rutere, ahụrụ m ka deede m na nwa ya na-anwụ n’agụụ. Ha eribeghị ihe ọ bụla kemgbe nwunye deede m nwụrụ. Mgbe m jụrụ ihe kpatara ya, ha zaghachiri na dị ka ọdịnala si dị, e kweghị ka ha mụnye ọkụ iji sie nri. M wepụtara onwe m isi nri, ma ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị tụrụ egwu na ọ bụrụ na mụ emebie omenala ndị ọgọ mmụọ nke a, onye ọ bụla ga-amalite ịwị ara!

“Akọwara m na dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, m na-akwanyere ihe Bible na-ekwu na Levitikọs 18:30 ùgwù, adịghịkwa m agbaso ọdịnala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Mgbe ahụ egosiri m ha broshuọ Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ. Mgbe ahụ ahụ ruru onye ọ bụla ala, m wee gaa n’ihu kwadebere deede m na ndị ọzọ ahụ nri. Anyaike m metụrụ ndị ikwu nke onye ahụ nwụrụnụ n’obi, ha wee kwere ịmụkwu Bible. Ha abụrụworị ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, ezinụlọ ahụ dum na-elekwa anya ka e mee ha baptism n’isi nso.”

Lee ka anyị si enwe obi ụtọ mgbe asụsụ dị ọcha ahụ nke eziokwu na-emeri mgbagwoju anya nke ụgha dị iche iche nke okpukpe, karịsịa echiche ndị ahụ e wusiri ike ndị na-eme ndị aka ha dị ọcha ohu! Site ná ngọzi Jehova, asụsụ ahụ dị ọcha na-agbasa na Zambia, ọbụna dị ka ọ na-eme gburugburu ụwa.—2 Ndị Kọrint 10:4.

[Igbe dị na peeji nke 9]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ

Afọ Ije Ozi 1994

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NA-AGBA ÀMÀ: 82,926

NKEZI: 1 Onyeàmà maka 107

NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 363,372

NKEZI NDỊ NKWUSA BỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ: 10,713

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 108,948

ỌNỤ ỌGỤGỤ NDỊ E MERE BAPTISM: 3,552

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 2,027

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: LUSAKA

[Foto dị na peeji nke 9]

Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower ná mpụga Lusaka

[Foto dị na peeji nke 9]

Ime nkwusa na Shimabala, ebe ndịda Lusaka

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya