Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Olè ndị bụ ndị Filistia ahụ e hotara n’ime Bible?
Bible na-ezokarị aka n’ebe ndị a maara dị ka ndị Filistia nọ, bụ́ ndị biri na Kenean mgbe ndị Chineke nke oge ochie weghaara Ala Nkwa ahụ. Ruo ogologo oge, ndị Filistia oge ochie ndị a megidere ndị Chineke, dị ka e gosipụtara n’ihe ndekọ nke nzute Devid na dike ahụ bụ́ onye Filistia nke aha ya bụ Gọlaịat.—1 Samuel 17:1-3, 23-53.
Bible na-egosi na ndị Filistia oge ochie sitere na Kaftoa n’akụkụ ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ osimiri Kenean kwata. (Jeremaịa 47:4) Olee ebe Kaftoa dị? Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia (1979) na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na ihe àmà adịghị enye ohere maka azịza doro anya, nkà mmụta akwụkwọ nke e nwere ugbu a na-ezo aka n’ebe àgwàetiti nke Krit dị (ma ọ bụ ma eleghị anya Krit tinyere Aegean Isles, ndị dịkọtara ọnụ n’ụzọ ọdịbendị) dị ka ebe o yikarịsịrị ka ọ pụrụ ịdị.”—Mpịakọta nke 1, peji nke 610.
N’ikwekọ na nke a, n’Emọs 9:7, nsụgharị New World Translation of the Holy Scriptures na-agụ, sị: “‘Ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’ebe m nọ, unu ụmụ Israel?’ ka Jehova kwuru. ‘Ọ̀ bụ na mụ esiteghị n’ala Ijipt kpọpụta Israel, sitekwa na Krit kpọpụta ndị Filistia, na Siria site na Kia?’”
A maghị mgbe ndị oge ochie ndị a na-arụ ọrụ mmiri si na Krit kwaga n’akụkụ Kenean nke e mesịrị mara dị ka Filistia, n’akụkụ ndịda nke ebe ọdịda anyanwụ nke ụsọ osimiri n’agbata Jọpa na Geza. O yiri ka ha anọrọworị n’ógbè mbara ala a dị larịị n’oge Abraham na Aịsak.—Jenesis 20:1, 2; 21:32-34; 26:1-18.
Ndị Filistia nọgidere na-enwe ike dị ukwuu n’ógbè a ogologo oge ka ndị Israel banyesịrị n’ala ahụ nke Chineke kweworo ha ná nkwa. (Ọpụpụ 13:17; Joshua 13:2; Ndị Ikpe 1:18, 19; 3:3, 4; 15:9, 10; 1 Samuel 4:1-11; 7:7-14; 13:19-23; 1 Ndị Eze 16:15) Ndị Filistia nọgidere n’obodo ukwu ha dị iche iche bụ́ Gat, Jabne, na Ashdod ruterịị n’oge ọchịchị nke eze Judia bụ́ Ụzaịa. (2 Ihe Emere 26:6) Obodo ukwu ha ndị ọzọ ndị a ma ama n’ihe ndekọ Bible bụ Ekrọn, Ashkelon, na Geza.
Alexander Onye Ukwu meriri obodo ukwu Filistia bụ́ Geza, ma ka oge na-aga, o doro anya na ndị Filistia kwụsịrị ịbụ ndị dị iche. Professor Lawrence E. Stager dere n’akwụkwọ bụ́ Biblical Archaeology Review (May/June 1991), sị: “A dọkwaara ndị Filistia n’agha gaa Babilọn. . . . Otú ọ dị, e nweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere ihe mere ndị Filistia ahụ a dọọrọ n’agha gaa ala ọzọ. Ndị ahụ pụrụ ịfọdụworị n’Ashkelon mgbe mmeri nke Nebukadreza gasịrị anọkwaghị dị ka agbụrụ kwụụrụ onwe ha. E nwekwaghị ihe ndekọ ọ bụla banyere ha n’akụkọ ihe mere eme.”
Aha ọgbara ọhụrụ ahụ bụ́ Palestine bụ nke e si n’okwu Latin na Grik nweta, nke na-edugaghachi n’okwu Hibru ahụ bụ́ maka “Filistia.” Ụfọdụ nsụgharị Bible n’asụsụ Arabic na-eji okwu a na-aghọtahiekarị ya na okwu e ji eme ihe maka ndị Palestine nke oge a na-eme ihe maka “ndị Filistia.” Otú ọ dị, Today’s Arabic Version na-eji okwu Arabic ọzọ nke dị iche eme ihe, si otú a na-akpa ókè n’etiti ndị Filistia oge ochie na ndị Palestine nke oge a.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ụfọdụ mkpọmkpọ ebe nke Ashkelon
[Ebe E Si Nweta Foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.