Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ndụ Dị Oké Ọnụ Ahịa Nye Gị?
NWA okoro nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu si n’okpukpu nke asatọ nke ụlọ elu ebe ọtụtụ ndị nwere ọnụ ụlọ ndị nke ha wutuo gbuo onwe ya. Ọ gụwo otu akwụkwọ nke kọwara isi n’elu wụtuo nwụọ dị ka nke “ihe mgbu ma ọ bụ ahụ erughị ala ma ọ bụ egwu na-adịghị na ya; kama nke ahụ, ọ na-atọ ụtọ.” Onye dere akwụkwọ a, nke e bipụtara na Japan, zọọrọ na nanị ihe ya na-eme bụ iwepụta “igbu onwe onye dị ka otu n’ime nhọrọ ndị e nwere ná ndụ.”
Ndị na-egbu onwe ha abụghị nanị ha na-egosipụta enweghị nkwanye ùgwù maka ndụ taa. Ndị na-akwọ ụgbọ ala ka ndị ara na-egosikwa nkwanye ùgwù dị nta maka ndụ. Ọbụna na ụfọdụ na-akwọ ụgbọ ala mgbe ha ṅụrụ mmanya, ọtụtụ na-eji oké ọsọ na-agbakwuru ọnwụ.
Ndị ọzọ na-egosi ókè dị nta ha ji ndụ ha kpọrọ ihe site n’oké okwu ha na-ekwu maka ihe ụtọ. Ndị na-ese sịga na-ajụ ịnapụ onwe ha sịgareti, ọ bụ ezie na ise sịga pụrụ ịkpata ọnwụ, a kpọwokwa ya iji nwayọọ nwayọọ egbu onwe onye. Kama ịnọgide n’ịdị ọcha n’ụwa nke ara mmekọahụ na-agba, ọtụtụ na-agbaso ụzọ nke inwe mmekọahụ aghara aghara nke na-edubakarị n’ọnwụ.
N’amaghịdị banyere ya, ụfọdụ na-anapụ onwe ha ọtụtụ afọ nke ndụ site n’iribiga nri ókè, ịṅụbiga mmanya ókè, enweghị mmega ahụ zuru ezu, na nchụso ihe ụtọ. Onye Japan na-ede akwụkwọ bụ́ Shinya Nishimaru dọrọ aka ná ntị, sị: “Àgwà iri ihe a na-akparaghị ókè na-akpaghasị ọrụ nile nke ahụ, nchụso nke nanị ntụsara ahụ na ihe ụtọ na-ebilatakwa ike ọkpụkpụ ahụ nke ndị mmadụ.” Ụfọdụ so na-enwe echiche nke ndị biri n’oge ochie bụ́ ndị sịrị: “Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”—Aịsaịa 22:13; 1 Ndị Kọrint 15:32.
Ee, enweghị nkwanye ùgwù maka ndụ jupụtara ebe nile taa. N’ihi ya, ọ pụrụ nnọọ ịdị mma ịjụ sị, Ruo ókè hà aṅaa ka ndụ dị oké ọnụ ahịa nye gị? È kwesịrị ichebe ndụ n’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe? È nwekwaranụ ihe bara uru karịa ndụ anyị nwere ugbu a?