“Otú ahụ Ka Ezi Ndị Kraịst Kwesịrị Ịdị Na-akpa Àgwà”
N’AKWỤKWỌ o dere na 1990 bụ́ Arbeit macht tot—Eine Jugend in Auschwitz (Ọrụ Na-egbu Gị—Ịbụ Nwa Okorobịa n’Auschwitz), onye lanarịrị Auschwitz bụ́ Tibor Wohl dekọrọ mkparịta ụka ọ nụchatara n’etiti mmadụ abụọ a tụkọrọ ya na ha mkpọrọ. Otu, bụ́ onye Austria, zọọrọ ịbụ “onye na-ekweghị ekwe.” Ma, o toro ndị mkpọrọ na-eyi akara triangle odo odo otuto—Ndị Mmụta Bible, dị ka a kpọrọ Ndịàmà Jehova n’ogige ahụ.
“Ha adịghị aga agha,” ka onye Austria ahụ gwara enyi ya. “Ọ ga-akara ha mma ka e gbuo ha kama ha igbu onye ọzọ. N’echiche m otú ahụ ka ezi ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-akpa àgwà. M ghaghị ịkọrọ gị banyere otu ihe na-enye obi ụtọ mere n’etiti mụ na ha. Anyị na ma ndị Juu ma Ndị Mmụta Bible nọkọrọ n’otu ụlọ n’ogige Stutthof. N’ụbọchị ndị ahụ Ndị Mmụta Bible aghaghị ịdị na-adọgbusi onwe ha ike n’ọrụ, n’èzí n’oké oyi ọtụtụ. Anyị apụghị ịghọta ụzọ ha si nọgide ndụ. Ha sịrị na Jehova nyere ha ume. Achịcha ha nwere dị ha oké mkpa, ebe ọ bụ na agụụ ji ha aka ọjọọ. Ma gịnị ka ha mere? Ha wekọtara achịcha nile ha nwere, taa ọkara ya ma nye ụmụnna ha, bụ́ ụmụnna ime mmụọ ha, ndị si n’ogige ndị ọzọ bịa n’oké agụụ ngụgbu, ọkara nke ọzọ. Ha nabatakwara ha ma susuo ha ọnụ. Tupu ha erie nri, ha kpere ekpere, e mesịakwa obi ụtọ jupụtara ha ihu. Ha sịrị na ọ dịghịzi onye agụụ na-agụ. Ị̀ hụlanụ, mgbe ahụ m chere n’onwe m sị, ‘Ndị a bụ ezi ndị Kraịst.’ Otú a ka m cheworo mgbe nile na ha kwesịrị ịdị. Lee ka ọ gaara esi magbuo onwe ya ịnabata ndị ibe m agụụ na-agụgbu n’ụzọ dị otú ahụ n’ebe a n’Auschwitz!”