Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/1 p. 32
  • Ike nke Okwu Obi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ike nke Okwu Obi Ọma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/1 p. 32

Ike nke Okwu Obi Ọma

“Obi nke hulatara ala n’ihi nchekasị, lee ka okwu obi ọma pụrụ isi nye ya ume ọhụrụ!” ​—⁠Ilu 12:25, Knox.

NDỊ Kraịst enwereghị onwe ha pụọ n’ihe isi ike. Mgbe ụfọdụ ha na-enwe nchekasị n’ihi ibi ndụ n’ime “oge dị oké egwu” ndị a.​—⁠2 Timoti 3:1.

Mgbe a nọ n’ahụhụ ọdachi dị otú ahụ, lee ihe ngọzi ọ bụ ịnụ okwu obi ọma site n’ọnụ enyi na-eguzosi ike! “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanna banyere ahụhụ,” ka Bible na-ekwu. (Ilu 17:17) A ma nwoke ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ Job ama ịbụ ụdị enyi nke a. Ọbụna Elifaz kwuru banyere ya, sị: “Mgbe mmadụ sụrụ ngọngọ, ike gwụ ya, ọ ghara inwekwa ume, okwu gị na-agba ya ume iguzo.”​—⁠Job 4:4, Today’s English Version.

Otú ọ dị, mgbe Job n’onwe ya nwere mkpa agbamume, Elifaz na ndị enyi ya ekwughị okwu obi ọma. Ha tara Job ụta maka ihe isi ike ya, na-enye echiche bụ na ọ ghaghị inwe mmehie ụfọdụ zoro ezo. (Job 4:8) Nsụgharị The Interpreter’s Bible na-ekwu, sị: “Ihe dị Job mkpa bụ obi ebere nke obi mmadụ. Ihe o nwetara bụ usoro echiche ndị bụ nnọọ ‘eziokwu’ na ndị magburu onwe ha nke okpukpe na nke omume ndị ike ha gwụworo mmadụ.” Ịnụ okwu Elifaz na ndị enyi ya gbaghasịrị Job isi nke ukwuu nke na a manyere ya iti mkpu sị: “Ruo olè mgbe [ka] unu ga-eme ka mkpụrụ obi m ruo újú? Ruo olè mgbe [ka] unu ga-ewere okwu zọpịa m?”​—⁠Job 19:2.

Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ịkpatara onye so anyị na-ejere Chineke ozi iti mkpu n’ihe isi ike n’ihi okwu anyị ndị a na-echeghị eche, ndị na-abụghị nke obi ọma. (Tụlee Deuterọnọmi 25:15.) Otu ilu Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe i kwuru pụrụ ichebe ndụ ma ọ bụ bibie ya; ya mere ị ghaghị ịnakwere ihe ndị sitere n’okwu gị nile.”​—⁠Ilu 18:21, Today’s English Version.

N’ịmata ike nke okwu ọnụ, ka anyị gbasoo ihe nlereanya Pọl onyeozi. Mgbe ọ nọ na Masedọnia, o ‘weere ọtụtụ okwu na-akasi ha obi.’​—⁠Ọrụ 20:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya